External Borrowing: Ọ bụ atụmatụ ibite ego n'ofesi anyị gbajọrọ ka Buhari wetekwara ọzọ - Shehu Sani

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigala akwụkwọ atụmatụ n'ụlọomeiwu ka ha nye ya ikike ibite ego na mba ofesi.
Akwụkwọ a kpọrọ "2016-2018 external borrowing plan" bụ nke Buhari zigaburu n'ụlọomeiwu n'afọ 2016 mgbe Bukola Saraki bụ onyeisi ha.
Ndị ụlọomeiwu jụrụ itinye aka n'atụmatụ ahụ n'agbanyeghi na ndị obi ọchịchị Buhari bụ 'Federal Executive Council' kwadoro ya.
Mana ụnyaahụ ndị ụlọomeiwu nke Ahmad Lawan bụ onyeisi ha gụpụtara atụmatụ a ọzọ n'ụlọomeiwu bụ nke onyeisiala Buhari zitere ya ha.
N'akwụkwọ ahụ onyeisiala Buhari sị na ụlọomeiwu nke asatọ tinyere aka n'ụfọdụ atụmatụ ahụ kama na ọ bụghị ha niile.
Ọ sịkwa na ọ bụ nke a mere gọọmentị ya arụghị ọrụ ha kwesiri ịrụ dịka ngwụpụta ihe n'ala, ọrụ ugbo, ahụ ike, ọkụ latrik nakwa agụmaakwụkwọ.

Ebe foto si, @NGRSenate/Twitter
Kedụ ihe mere ndị ụlọomeiwu jiri jụụ atụmatụ a n'afọ 2016?
Shehu Sani bụbu onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Kaduna Central n'aha APC kọwara ihe mere ha ji jụụ ịnabata atụmatụ ahụ n'afọ 2016.
Ọ sị n'afo 2015 tupu gọọmentị Buhari abata n'ọchịchị Naịjirịa ji ego dị ijeri dọla iri na nde narị iri atọ na abụọ n'ụgwọ site na mbite ego n'ofesi.
N'ime afọ atọ gọọmentị Buhari ritere ụgwọ dị ijeri dọla iri na nde narị iri asaa na asaa. Nke mere ya ijeri dọla iri abụọ na ụma Naịjirịa ji n'ụgwọ.
Sani kwuru na ọ bụrụ na ha nyere gọọmentị ohere ibite ijeri dọla atọ ahụ na ego Naịjirịa ga-ejizi n'ụgwọ ga-abụ ijeri dọla iri ise na abụọ.
Na ọ bụ n'ihi nke ahụ mere ha ji gbajọọ inye onyeisiala Buhari ikike ibite ego mgbe ahụ.

Ebe foto si, Senator Shehu Sani/Instagram
Ncheta Paris Club
Sinetọ Sani sị na ọ bụ ịkwụghachị ụgwọ mere ha jiri gbajọọ atụmatụ n'afọ 2016.
Ọ sịkwa na ọ dịghị mma ibukwasị ndị Naịjirịa ụdịrị ibu mbute ego a ga-apụta.
Maazi Sani kwuputakwara na ọdịghi mma dika onye bụbụ onyeisiala bu Olusegun Obasanjo ịnapụta Naịjirịa n'okwu iji mba ofesi ụgwọ mgbe ọ na-achi mba a alaghachie na ya.
Cheta na Obasanjo nwetere ọgbaghara ụgwọ ijeri dọla iri na asatọ n'aka ndị akpọrọ Paris Club n'afọ 2005.










