Unai Emery na Arsenal agbaala alụkwaghịm

Unai Emery

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Arsenal ji ọnụọgụgụ 19 nọdụ n'azụ ndị na-achị ọgbọ Premier League bụ Liverpool

Arsenal achụọla onye nchịkọta ha bụ Unai Emery sị ya kwakọrọ pụọ maka na ọ naghị eme nke ọma.

Onye kwuru nke a bụ Stan Kroenke so n'otu n'ime ndị nwe Arsenal n'ime ozi o wepụtara n'ehihie taa.

Ha sị na Freddie Ljunberg ga-anọchitụ anya nwa mgbe nta ruo mgbe ha ga-enwete onye ọzọ dịka onye nchịkọta n'uju.

Unai Emery bụbu onye nchịkọta Paris St-Germain na Sevilla maburu ọkwa ịchịkọta Arsenal n'ọnwa Mee afọ 2018.

Ọnọdụ Arsenal na Manchester United bụz agba ekpere chi

Unai Emry na Ole Gunnar Solskjaer

Ebe foto si, Getty Images

Igbo sị 'ma agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ', nke a bụ ọnọdụ Arsenal na Man. United n'asọmpi Europa.

Dịke Ịngland abụọ a gbara nkịtị ka 'ụmụaka' abụọ dịka Eintracht Frankfurt na Astana gbaa ha ukwu n'ala ụnyaahụ.

N'agbanyeghi na Arsenal nọ n'ụlọ ha 'ọgbọegwuregwu Emirates' ma buru ụzọ nye ndị Frankfurt goolu na nkeji 45 site n'aka Pierre-Emerick Aubameyang.

Ha nọkwa ebe ahụ na-ele anya mgbe Frankfurt si n'azụ saa goolu ahụ ma nyekwa goolu ọzọ bụ nke ha ji merie Arsenal.

Eintracht Frankfurt meriri Arsenal

Ebe foto si, Reuters

Goolu abụọ ndị Eintracht Frankfurt ji merie Arsenal si n'aka Daichi Kamada n'ime nke 55 na 64 n'ụsoro.

N'aka nke ọzọ Manchester United bụ ndị Astana lere ọbịa, bu ụzọ nye Astana goolu site n'aka Jesse Lingard na nkeji 10.

Mana Dmitriy Shomko nke Astana siri ọnwụ ma saa goolu ahụ Manchester United nyere na nkeji 55.

Astana meriri Manchester United

Ebe foto si, Reuters

Site mgbe ahụ gawazie Astana kwanyere Man. United ọkụ n'ike nke mere Di'Shon Bernard onye Man. United ji nye onwe ha goolu na nkeji 62.

Nke a mere Astana ji were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United na ngwụcha asọmpi a.

Mmeri a e meriri Arsenal na Manchester United e meela ka ọnọdụ ndị nchịkọta ha bụ Unai Emry na Ole Gunnar Solskjaer bụrụ 'A gbaa e kperechi'.

Ndị uweojii gara n'ụlọ agadi nwaanyị wee hụ ozu di ya n'ime 'freezer'

Us police tape (file picture)(

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii gara ịza oku na be otu nwaanyị dị afọ 75 hụru na ọnwụọla mana nke tụrụ ha n'anya bụ na ha hụrụ ozu di ya n'ime ntụ oyi.

Ndị uweojii sị na ha na-eche na aka mmadu adịghị n'ọnwụ nwaanyị ahụ aha ya bụ Jeanne Souron-Mathers di afọ 75.

Ha sị na a hụru ya bụ nwaanyị ebe edina n'ala n'ọnwụ, mana ọ bụ ozu di ya ka ha che na ọkwụghi ọtọ makana o nọọla n'ime ntụ oyi ahụ afọ.

Onye uweojii aha ya bụ Jeremy Hansen na mpaghara "Salt Lake City" sị na ya bụ ihe na "esi isi.

Map

Agbanyeghi nke a, ndi uweojii si na ha amaghị ma aka nwaanyi ahụ ọ dị n'ọnwụ di ya.

Ndị ọgbataobi ha sị na otela ha hụrụ nwoke ahụ.

Ụfọdụ sị otu afọ ebe ndị ọzọ sị na oruola afọ iri na otu.

Burkina Faso: Mba Amerịka sị ka ndị be ha nọ mba a kpọla ụmụ ha

Ndi uweojii Burkina Faso

Ebe foto si, Getty Images

Mba Amerịka na-ekwuola na mmadụ niile dị afọ iri abụọ na otu gbadawa na-arụ ọrụ maọbụ na buru nwa onye ọrụ na ụlọ mmekọ ha na Burkina Faso kwakọrọ lawa.

Nke a na-abịa dịka ha sị na ọnọdụ nchekwa na mba ahụ.

N'ime akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara,ndị na-anọchịte anya Amerịka na Burkina Faso sị agbanyeghi na onweghi ihe ha nwereike rụtụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe a ha kwuru, ọnọdụ nchekwa na ya bụ mba eruola ebe ọ gaghi amasị ụmụaka ịnọ n'ụlọ ọrụ ha.

Ndị ọrụ ndi ọzọ ka ga-anọ.

Nke a na-abịa dịka mba Amerịka wepụtara ndụmọdụ o nyere ndị be ha, nke sị ha gbanri ịga mba Burkina Faso maka mkpa mkpa ndi oyi ndu egwu na-akpa na ya bụ mba.

Ndi oyi ndu egwu na-enyue ezigbote nsogbu na mba ahụ nke gunyere ị na-agagharị na-achọ ndị ha ga-awakpo.