Mauricio Pochettino: Tottenham esepụla ya oche n'otele

Pochettino

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pochettino nọrọ afọ ise dịka onye nchịkọta/nkuzi Tottenham
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ mere ugbua na-akọwa na Tottenham ejiri azịza zapụ Mauricio Pochettino chịkọtara ha afọ ise.

N'okwu ha depụtara iji gbasaa ozi ọchụchụ ya, Daniel Levy bụ onyeisioche klọb ahụ kwuru sị "ọ rara anyị ahụ ime mgbanwe a.

"Ọ bụghị mkpebi anyị mere n'ọkụ ọkụ, kama ụdịrị ihe anyị gbatara na League na ngwụcha afọ gara aga na nke anyị na-agbata na mbido afọ ọhụrụ a agaghị ka anyị si chọọ".

EFCC na-enyo etu nwoke nọ na mkpọrọ si gwunwuo mmadụ nde dọla

Hope Olusegun Aroke

Ebe foto si, EFCC

Otu nwoke nọ nga n'afọ 24 n'ụlọmkpọrọ Kirikiri dị na Legọs maka iji intanet gwuo chamdum anọrọla ebe ahụ mee nke ka nke.

EFCC chọpụtara na Hope Olusegun Aroke menwụrụ nke a n'ihi na o nwere ohere ịnwe ekwenti na ịntanet nke onye nọ na mkpọrọ ekwesịghị inwe.

Gịnị ka Uche Nwosu ga-eme ugbua?

Uche Nwosu

Ebe foto si, Facebook/Nwosu

Nke na-akpọtụ ugbua bụ na ụlọikpe mkpegharị n'Abuja akụchapụla akwụkwọ Uche Nwosu nke Action Alliance gbara Emeka Ihedioha nke PDP maka mpụtara ntuliaka ha mere na Febuary.

Uche Nwosu na Emeka Ihedioha chịpụrụ ya na ntụlịaka nke gọvanọ n'Imo steeti bụ nke Inec nyere Ihedioha mmeri.

Nke a na-eme dịka akwụkwọ Ararume na Uzodinma gbara Ihedioha dara mmiri.

Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke Jọstis Justice Oyebisi Omoyele nọ n'isi ya kpebiri ya bụ ikpe.

Ndị a nille sị na Ihedioha enwetazughị vootu ikpo abụọ n'ụzọ atọ a chọrọ na steeti ahụ maka onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ.

Nwosu, Ararume na Uzodinma rịọrọ ụlọikpe ka e wezụga mkpebi ụlọikpe ntụliaka bụ nke sị na Ihedioha meriri na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị nke afọ 2019.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọzọ mere taa bụ na ụlọikpe ukwu n'Ikeja kpụpụtara Ogunyemi Olalekan ka ọ bịa zara ọnụ ya.

Olalekan bụ onye uweojii ahụ a sị gbagburu nwokorobịa aha ya bụ Johnson Kolade na ọnwa maachị afọ a ebe ha na-ekiri bọọlụ na Mangoro, Legọs.

Okpunnabụenyị adọkaala

Here are some views on the EU

Ebe foto si, Students for Britain

N'ofesi, ụzụ atụọla ka a chọpụtara na ụfọdụ okpunnabụenyi ndị otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ Marie Stopes kere na Uganda nwere oghere maọbụ nwee ike ịgbawa dịka ngalaba na-ahazi ọgwụ sị gbaa n'ama.

Otu egwuregwu Edo erie ka bọsụ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'egwuregwu, Edo steeti akpụọla otu egwuregwu ụmụnwaanyị ha isi akpụrụ Albertị.

Gọọmenti steeti ahụ ekwetala na ha ga-ebido ịkwụ ụmụnwaanyị ahụ ụgwọ, dịka akwụrụ otu egwubọọlụ ụmụnwoke Bendel Insurance.

Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ọkụ gbagburu otu ezinaụlọ gụnyere mmadụ anọ n'ime abali

Ụlọahia ọkụ gbara

Ebe foto si, Anambra Police

Nkọwa foto, Blessing Okafor hapụụ ụmụ ya atọ n'ime 'Container' gawa mkpa ya oge ọkụ gbara

Ụzụ akwa na-atụ na Benue steeti ebe nwoke mmadụ aha ya bụ Seker Akaa, bụ onye odeeakwụkwọ ebighebi n'ụlọọrụ gọomentị, so nwunye ya bu afọ ime nakwa ụmụ ya abụọ were nwụọ n'ọkụ ahụ.

Ndị ụweojii kwetara na otu ezianụlọ gụnyere mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba ebe ndị agbatobi kwuru na ndị ahụ ahụghị ụzọ ha ga-esi gbalahụ ọkụ ahụ mgbe ha tetara.

Ndọrọndọrọ ọchịchị

David Lyon na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Onyeisiala Muhammadu Buhari agwaala ndị otu PDP na ndị ọzọ ha gbara gawa ụlọikpe maọbụrụ na mpụtara ntuliaka e mere na Kogi nakwa Bayelsa steeti edoghi ha anya.

O kwuru nke a dịka Inec weliri aka Yahaya Bello dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi steeti.

N'egwuregwu,

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Otu na-achịkọta ndị egwuregwu n'ụwa niile edegarala minista na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa akwụkwọ ozi ịkweta na ha enwetala dọlla otu narị puku na iri atọ bụ ụgwọ ha kwufere Naịjirịa mbụ.

Gee Nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile