Ike Ekweremadu: Ihe mere mba Briten ji jụa inye Naịjirịa ohere ịkpọlata ya

Ebe foto si, MET Police
Gọọmenti mba Briten ajụla arịrịọ Naịjirịa rịọrọ ka ha nyefee onye bụbu Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadụ n'aka Gọọmenti Naijiria ka ọ laghachite Naịjirịa were gaa mkpọrọ maka ikpe a mara ya na mba Briten.
Cheta na ụlọikpe mba Briten tụrụ Ekweremadu mkpọrọ afọ itoolu n'afọ 2023 maka ebubo ịkpa nkata ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ dịka ya na nwunye ya na otu dọkịta kpara nkata si Naijiria kpọta otu nwata nwoke na Briten maka ịnara nwata ahụ akụrụ nye nwa Ekweremmadu nwaanyị nwere nsogbu akụrụ.
Na nsonso a, ụfọdụ ụlọntakụkọ dị na Naijiria gbara ama na Onyeisiala Bola Tinubu zigara minista Naịjirịa na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Yusuf Tuggar na ụfọdụ ndị ọrụ Gọọmentị Naịjirịa ka ha gaa zute ndị ọrụ Ministrị na-ahụ maka ikpe nke mba Briten rịọ ha ka ha hapụ Ekweremadu ka ọ bịa na Naijiria nọtọpụ afọ ole o nwere na mkpọrọ.
Mana akwụkwọ akụkọ Guardian nke mba Briten kwuru na otu onye na Ministrị na-ahụ maka ikpe gwara ha na a jụrụ arịrịọ ahụ nke gọọmenti Naịjirịa rịọrọ.
Ụlọntakụkọ ahụ kwuru na gọọmentị Briten na-atụ uche na Naijiria enweghị ihe ha ga-ejideli aka gosiri na Ekweremadu ga-anọ afọ ole fọrọ na mkpọrọ Naịjirịa.
Cheta na a tọhapụrụ nwunye ya bụ Beatrice Ekweremadu, onye a mara ikpe afọ anọ na ọnwa isii, ebe ọ nụrụ ọkara ya n'ụlọmkpọrọ, na mbido afọ a dịka ọ laghachiri Naịjirịa kemgbe ahụ.
Ike Ekweremadu: A tụọla Ekweremadu na nwunye ya mkpọrọ na mba UK

Ebe foto si, Ike Ekweremadu
Ụlọikpe mba UK atụọla Ike Ekweremadu mkpọrọ afọ itoolu na ọnwa asatọ.
A tụkwara nwunye ya mkpọrọ afọ isii, mana e mechara butuo ya ka ọ bụrụzie afọ anọ na ọnwa isii.
Onye nke atọ bụ Obinna Obeta nwatara mkpọrọ afọ iri.
Ọkaikpe ahụ aha ya bụ Justice Johnson kwuru na ya nwetara ọtụtụ ozi na-ekwu etu Ike Ekweremadu si bụrụ ezigbo nwaafọ, tinyere ozi si n'aka aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo, onyeisi ụlọ omeiwukwu Naịjirịa nakwa otu Ecowas.
Ndị uweojii mba UK chọburu ka a tụọ Ekwermadu, nwunye ya na Obeta mkpọrọ ga-eru afọ 18.
E jidere Ekweremadu na nwunye ya na UK n'ụbọchị 23 nke ọnwa Jun 2022.
Achọghị m ego ọbụla n'aka ezinụlọ Ekweremadu - Nwata nwoke a chọrọ iwere akịrị ya
Nwata nwoke a chọrọ iwere akịrị ya iji tinyere nwa nwaanyị Ike Ekweremadu agwala ụlọikpe na mba UK na ya achọghị ego iti aka n'obi ọbụla n'aka ezinụlọ ahụ.
Nke a mere n'ụlọikpe taa bụ Fraịde, dịka a na-atụ anya na ụlọikpe ga-ekwupụta ntaramahụhụ a ga-enye Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice.
Dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu, ọkaikpe jụrụ nwata nwoke ahụ ma ọ chọrọ ka ezinụlọ Ekweremadu kwụọ ya ụgwọ iti aka n'obi n'ihi ihe ọjọọ ha mere ya, mana o kwuru na ọ chọghị ego ọbụla n'aka ha.
Cheta na ụlọikpe nyere iwu ka a ghara ịkpọpụta aha nwata nwoke ahụ iji chekwaa ya.
Mana ndị ọkaiwu nwata nwoke ahụ rịọrọ ka e nye nwata nwoke ahụ ikike ịnọrọ na mba UK bụ nke a na-akpọ asylum na bekee.
O dobeghị anya mkpebi e nyere maka nke a.
Ikpe a mara Ekweremadu

Ebe foto si, Met Police
N'ịma Ekweremadu ikpe, ọkaikpe Johnson kwuru na ya lebara anya n'ihe dị icheiche nke gụnyere:
- Ekweremadu ma nke ọma na nwata nwoke ahụ bụ nwata ma bụrụkwa onye ụbịam
- Ekweremadu ma nke ọma ọnọdọ ọjọọ ụbịam na-edebe ndị mmadụ n'ihi na o hibere ụlọọrụ nke o kwuru na o ji enyere ndị ogbenye aka
- Oge Ekweremadu chọpụtara na akụrụ nwata nwoke ahụ adabeghị na nke nwa ya nwaanyị, ọ malitere ịchọ onye ọzọ ọ ga-ejikwa mee otu ihe ahụ
- Ekweremadu achọtalarị ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị ọ ga-esi n'ime ha nweta onye ọzọ ga-enye nwa ya nwaanyị akụrụ
- Ekweremadu n'onwe ya nwekwara ọrịa nke ọ na-arịa
- Ụlọikpe ọbụla amabeghị Ekweremadu ikpe mbụ
- Ọtụtụ ndị a ma aha ya dere akwụkwọ iji gbaa akaebe na Ekweremadu bụ ezigbo mmadụ; mmadụ dịka Archbishọp Emmanuel Chukwuma, onyeisiala n'oge gara aga bụ Olusegun Obasanjo, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na ụlọ omeiwu nta Naịjirịa, nakwa nwa ya nwaanyị bụ Sonia
- Ekweremadu mere ihe a n'ihi ọnọdụ ahụike ọjọọ nke nwa ya nwaanyị nọ n'ime ya
- Ekweremadu gaara achọ onye ọzọ ga-enye nwa ya nwaanyị onyinye akụrụ, na-abụghị onye a ga-akwụ ụgwọ, ọ bụladị site na ndị ezinụlọ ya
Ihe ndị a niile ka ọkaikpe Johnson sị na ya tulere tupu o kpebie ịtụ Ekweremadu mkpọrọ afọ itoolu na ọnwa asatọ, tinyere oge ọ nọrọla na mkpọrọ dịka a na-ekpe ikpe a.
E kee oge a ụzọ atọ, Ekweremadu ga-anọ ụzọ abụọ n'ụlọ mkpọrọ ma nọtọpụ ndị ọzọ n'ọrụ enyemaka obodo.
Ikpe a mara Beatrice Ekweremadu

Ebe foto si, Met Police
N'ịma Beatrice Ekweremadu ikpe, ọkaikpe Johnson kwuru na ya lebara anya n'ihe ndị a:
- Beatrice Ekweremadu esoghị na ndị chọtara onye chọrọ inye onyinye akụrụ ya, o soghikwa na ndị chọtara ndị nke ọzọ e chere gaara enye Sonia onyinye akụrụ
- Ọ bụ nwaanyị nwere ezigbo agwa na-enwebeghi ikpe ọbụla a mara ya
- O nwere ọrụ dị mkpa ọ na-arụ n'ileta nwa ya nwaanyị bụ Sonia onye nọ n'ọrịa
N'ihi ihe ndị a ka a tulere wee kpebie ịtụ Beatrice Ekweremadu mkpọrọ afọ anọ na ọnwa isii.
Ọkaikpe kwuru na Beatrice a ga-agbakọnye ụbọchị Beatrice nọrọla dịka onye e ji eji n'oge mkpọrọ ya.
Ọ ga-anọ ọkara oge mkpọrọ ya n'ime ụlọ mkpọrọ ebe ọkara nke ọzọ ka ọ ga-anọchapụ n'ịrụ ọrụ obodo.
Ikpe a mara Obinna Obeta

Ebe foto si, Met Police
N'ịma Obinna Obeta ikpe, ọkaikpe Johnson kwuru na ya lebara anya n'ihe ndị a:
- Obeta kpacha anya họrọ nwata nwoke ahụ n'ihi na ọ bụ nwata ya na ndị ezinụlọ ya anọghị, ma bụrụkwa onye ụbịam
- Oge atụmatụ iwere akụrụ nwata nwoke ahụ kụsara, Obeta gbara mbọ ịchọta onye ọzọ ga-enye akụrụ ya
- Obeta bụ ezigbo nwa afọ na-enwebughị ikpe ọbụla a mara ya
- Ọ rụọla ọrụ ọma dị icheiche dịka dọkịta
- O nwekwara ọrịa nke ya dịka onye merela mgbanwe ọrịa akụrụ n'oge gara aga, mana ọnọdụ ahụike ya bụ ihe e nwereike ijikwa n'ụlọ mkpọrọ
N'ihi nke a ka ọkaikpe Johnson ji tụọ dọkịta Obeta mkpọrọ afọ iri.
E kee oge a ụzọ atọ, Obeta ga-anọ ụzọ abụọ n'ụlọ mkpọrọ ma nọtọpụ ndị ọzọ n'ọrụ enyemaka obodo.
Organ Harvesting: Etu ikpe Ike Ekweremadu na nwunye ya ga-esi gaa taa na mba UK

Ebe foto si, Met police
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Taa bụ Fraịde, ụbọchị ise nke ọnwa Mee 2023, ka ụlọikpe na mba United Kingdom ga-ekwupụta ntaramahụhụ a ga-enye Ike Ekweremadu, nwunye ya ụ Beatrice na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta, maka ebubo ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.
Cheta na ụlọikpe ahụ mara mmadụ Ekweremadu na nwunye ya ikpe maka ebubo ahụ, n'ọnwa Maachị afọ a.
Dịka iwu mba UK si dị, ntaramahụhụ kachasị e nwereike inye mmadụ n'ihi ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ bụ ịtụ ya mkpọrọ ndụ ya niile.
Ekweremadu na nwunye ya na dọkịta Obeta bụ ndị mbụ a ga-ama ikpe n'ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ kamgbe e mechara iwu machiri ịgba ohu ọgbara ọhụrụ n'afọ 2015.
Ọtụtụ otu mba ụwa dị icheiche nakwa ndị aha ha na-ada ụda arịọla mba UK ka e meere Ekweremadu Ebere na ntaramahụhụ a ga-enye ya.
Otu ndị a gụnyere Ụlọ omeiwu Naịjirịa; Ụlọ omeiwu nke otu jikọrọ mba niile dị na Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Ecowas n'ịchafụ; otu 'International Human Rights Commission (IHRC); aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjọ na ọtụtụ ndị ọzọ.
Etu ikpe Ekweremadu si aga
Ikpe ahụ amalitebeghị n'ihi na ndị ọrụ nchekwa na-akpụta nwunye Ike Ekweremadu bụ Beatrice n'ụlọikpe kpụgara ya n'ụlọikpe ọzọ na-abụghị ebe e a nọbu ekpe ya bụ ikpe.
Mana a na-atụ anya na ikpe ahụ ga-amalite n'oge adịghị anya.
Akụkọ na-abịa.
Ebubo e ji maa Ekweremadu ikpe

Ndị uweojii mba UK jidere Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice n'ọdọụgbọelu Heathrow dịka ha chọrọ ịgawa mba Turkey.
Ha kwuru na Ekweremadu ji ụzọ aghụghọ kpọta otu nwata nwoke dị afọ 21 na mba UK iji were akụkụ akịrị ya tinyere nwa ya nwaanyị bụ Sonia onye nwere ọrịa akịrị.
Nwata nwoke ahụ, onye ụlọikpe nyere iwu ka a ghara ịkpọpụta aha ya, gbapụrụ ọsọ ga kpesara ndị uweojii maka nke a nke mere e ji jichie Ekweremadu na nwunye ya.
Ndị uweojii jidekwara otu nwoke aha ya bụ Obinna Obeta bụ dọkịta a sị na aka ya dị n'ịkpọta nwata nwoke ahụ si Naịjirịa bịa mba UK.
Ekweremadu kwuru na ọ bụ nwata nwoke ahụ ji aka ya kweta inye akịrị ya dịka onyinye iji zọọ Sonia ndụ, mana ndị ọrụ nchekwa mba UK kwuru na nwata nwoke ahụ gwara ha na ya amaghị ihe e ji kpọfete ya na UK, na ọ bụ oge ndị dọkịta na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ụlọọgwụ ka o ji mata, kpatara o ji gbaa ọsọ.
Ọzọkwa bụ na iwu mba UK amachighi mmadụ inye akụkụ ahụ ya dịka onyinye nye onye ọzọ, mana ọ gaghị ana ego ọbụla maka ya. Ọ bụrụ na ego ọbụla dị n'ime ya bụ nkwekọrịta, ọ gaghị abụzi onyinye ka ọ bụrụla ịzụ ahịa, nke bụ ihe iwu megidere.
Ebubo ọzọ e boro Ekweremadu na nwunye ya bụ ịgba ohu ọgbara ọhụrụ nke bekee na-akpọ 'Modern Day Slavery', maka iji ụzọ aghụghọ kpọrọ mmadụ gafee mba ọzọ na-emeghị ka onye ahụ mara kpọmkwem ihe njem ahụ bụ maka ya.









