Ike Ekweremadu ka ga-anọ nga ruo Ọktoba 31

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook

Ike Ekweremadu bụ sịnetọ na Naịjirịa, nwunye ya na otu onye bi na Lọndọn wuchiri n’ụlọikpe dị na Lọndọn n’ụbọchị 4 nke ọnwa Ọgọstụ 2022 maka ebubo ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.

Nwunye Ekweremadu wuchiri n’ụlọikpe Old Bailey maka ịrịọ arịrịọ ebe Ekweremadu na Obeta bụ ndị nọ n’ụlọ nga sonyere n’ihe onyonyo. E kweghi ha rịọ arịrịọ ọbụla kama a sị ha kwupụta aha ha na onye ha bụ. Ọkaikpe Richard Marks QC sị na ụlọikpe ukwu ga-eleba anya n’ikpe ahụ. Ọ sị na e nwere ike inwe ohere ịtụle ikpe ahụ malite n’ọnwa Mee afọ ọzọ nke nwereike iwe izuụka atọ maọbụ anọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ike Ekweremadu na Nwunye ya

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook

E bugharịrị ikpe maka arịrịọ ha gawa n’ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba afọ 2022. Ọkaikpe a kwudosiri ike n’iwu o nyere ka a tọhapụ nwunye Ekweremadu ebe Ekweremadu na Obeta ka ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ. E boro Ike Ekweremadu na nwoke ọzọ bụ Obinna Obeta ebubo ịkpa nkata ka a kpọbata nwoke a iji ghọrịgbuo ya. Ebe e boro nwunye ya na Obeta dị afọ 50 ebubo maka ịhazi njem nwoke ahụ iji ghọrịgbuo ya. Iwu ndị a a sị ha dara mere n’agbata ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 na ọnwa Mee afọ 2022. Cheta e boro Ekweremadụ dị afọ 60, nwunye ya bụ Beatrice Nwanneka dị afọ 55 ebubo na ha kpọtara otu nwoke dị afọ 21 site na Naịjirịa gaa mba Briten. Ọkaiwu gọọmentị sị na ha kpara nkata iwepu akụrụ nwoke ahụ iji wee tinye n’ahụ nwa ha nwaanyị. Nwoke ahụ jụrụ ka e wepụ akụrụ ahụ ya dịka e mechara nyocha n’ahụ ya n’ụlọọgwụ Royal Free dị na Hampstead, Lọndọn. Ebubo ọzọ bụ na Ekweremadu na ezinaụlọ ya nọ na-emekpa nwoke a ahụ dịka ohu ruo mgbe ọ gbagara n’aka ndị uweojii Staines dị na Surrey. A nwuchiri Ekweremadu na nwunye ya n’ọdọụgbọelu Heathrow n’ụbọchị 21 nke ọnwa Juun mgbe ụgbọelu ha si mba Turkey.

Ike Ekweremadu na nwunye ya

Ebe foto si, Ike Ekweremadu Facebook

Ụlọikpe ekwenyela na ọ bụghị nwata ka Ekweremadu chọrọ ịnara akịrị ya

Ụlọikpe Ukwu dị na Lọndọn, mba Briten ebe a na-ekpe Ike Ekweremadu bụ Sinetọ n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria na Beatrice nwunye ya ikpe maka "iji n'ụzọ aghụghọ napụ mmadụ akụkụ ahụ ya", ekwenyela na ọ bụghị akịrị nwatakịrị ka ha chọrọ iwere.

Ọkaikpe Tan Ikram nọ n'isi ikpe a, kwuru na nwamadi a na-achọ iwere akịrị ya abụchaghị nwatakịrị etu e si chebuo, na o ruola ihe e ji okenye eme.

Mana iwu gbasara iji mmadụ mere ohu n'ọgbara ọhụrụ a nke mba UK a kpọrọ 'Modern Slavery Act', kwuru na a gaghị akpọpụta aha maọbụ gbaa onye a chọrọ ịghọgbu napụ akụkụ ahụ ya n'anwụ.

Nke a pụtara na agaghị akpọpụta aha ya bụ nwamadi ahụ Ekweremadu kpọọ gaa UK.

Ka ọ dị ugbua, e yigharịala ikpe a ruo abalị anọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2022.

Ekweremadu abịala n'ụlọikpe Mba Briten taa
Ike Ekweremadu na nwunye ya, Beatrice

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Ike Ekweremadu na nwunye ya

Onye bụbu Osote onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Ike Ekweremadu bịara n'ụlọ ikpe mba Briten taa bụ Tọzde.

Ekweremadụ na-azara ọnụ ya n'ebubo na ọ kpọtara nwata na mba ahụ iji nwere akụkụ ahụ ya.

Ndị ọchịchị Naijiria zigara ndị nọchitere anya ha n'ụlọikpe dịka onye ntaakụkọ anyị nọ London siri kwuo.

Ndị nochitere Gọọmenti Naijiria
Nkọwa foto, Ndị Gọọmenti Naijiria zigara ndị nochitere ha n'ụlọikpe

A nwụchiri Ekweremmadu gbara afọ 60 na nwunye ya bụ Beatrice Nwanneka dị afọ 55 n'ọnwa Juun, afọ 2022 dịka a na-ebo ha ebubo imegide iwu metụtara ịgba ohu nke agba ọhụrụ nke afọ 2015.

Nke a bụ nke atọ Ekeremmadu ga-apụta ụlọikpe maka okwu a.

Ndị uweojii mba ahụ kwuru na nwata ha kpụtara inwere akụkọ ahụ ya dị afọ 15.

Kemgbe a nwụchiri ya, ụlọiwu Naijiria agbala mbọ ịhụ na e nwetara ya ọkaiwu ga-anochite ya n'ikpe ahụ.

Na nsonso a, Ụlọikpe Ukwu dị na Naijiria nyere NIMC iwu ka ha gbaa n'anwụ ozi banyere nwata ahụ Ekweremadu na nwunye ya kpọgara alabekee.