Organ Harvest: Ụlọikpe Naịjirịa enyela NIMC iwu ka ha nyefee Ekweremadu ya 'data' nwata ahụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela ntuziaka ka e wepụta ozi nke Bekee kpọrọ 'Data' nwata nwoke ahụ nke onye bụbu Osote onyeisi ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Ike Ekeremmadu na nwunye ya kpọ ga mba Briten maka inye nway ha akịrị.
Ụlọikpe mba Briten jichiri Ekweremadu na nwunye ya maka ebubo na ha lagara nwata dị afọ 15 mba ahụ iji nwara akụkọ ahụ ya dịka iwu mba ahụ megidere inye ego iji iwupụ akụkụ ahụ onye dị ndụ.
Ọkaikpe Inyang Ekwo nyere iwu ahụ na mkpebi ewepụtara n'ụbọchị Fraịde na-agwa NIMC, NIS nakwa ụlọakụ abụọ ha nyefe ihe niile ha ji gbasara nwa ahụ n'aka onye omeiwu ahụ na nwunye ya.
Echiche kwadoro mkpebi a bụ iji chọpụta ezi afọ nwa ahụ dị dịka ndị na-ekpe Ekweremadu ikpe na mba Briten na-ekwusi ike na nwa ahụ dị afọ iri na ise.
Ike Ekweremadu: Ụlọikpe eyigharịala ikpe ya na nwunye ruo July 7 - Ụlọikpe UK

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
Ike Ekweremadu bụ onye omeiwu Naịjirịa anwụchiri na mba Briten apụtala n'ụlọikpe taa dịka ikpe ya na-aga n'ihu.
Cheta na eboro ya ebubo izobata nwatakịrị dị afọ iri abụọ na ise iji wepụ akụkụ ahụ ya.
Ekweremadu agọrọla isi onwe ya na nwoke ahụ abụghị obere nwa, o kwuru na nwoke ahụ akarịala afọ iri na ise.
Mana onye na-anọchite anya mba Briten na ya bụ ikpe na-ekwusi ike na nwoke ahụ bụ nwata dị afọ iri na ise.
E bugharịala ikpe ya
Ekweremadu na nwunye ya ga-anọ na mkpọrọ ruo July 7 - Ụlọikpe UK
Ụlọikpe 'Uxbridge Magistrates Court' ekpebiela na Ike Ekweremadu na nwunye ga-anọgodu na mkpọrọ ruo ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị afọ 2022.
Mkpebi a na-abịa dịka a kpụpụrụ Ekweremadu na nwunye ya ụlọikpe maka ebubo na ha ji ụzọ aghụghọ kpọta otu nwata nwoke dị afọ iri na ise na mba UK ka ha were akụkụ ahụ ya ụfọdụ, nke bekee na-akpọ 'organ harvesting'.
A nwụchiri Ekweremadu na nwunye ya n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Jun.
Ndị uweojii kwuru na ọ bụ nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ise ka Ekwremadu na nwunye ya chọrọ iwere akụkụ ahụ ya.
"Anyị azọpụtala nwatakịrị ahụ ugbua, anyị na ndị na-enyere anyị aka na-agbazị mbọ inye ya nkwado," ndị uweojii kwuru.
Oge okwu a bịara n'ụlọikpe, ọkaiwu Damla Ayas gwara ọkaikpe na ọ dị mkpa ịnata 'Attorney General' ikike tupu ya bụ ikpe agawa n'ihu.
O kwuru na ọ ga-ewe abalị iri na anọ tupu ha enweta ikike a.
Nke a mere ọkaikpe ji nye iwu ka eyigharịa ya bụ ikpe ruo abalị iri na anọ na-abịa abịa, nke bụ ụbọchị asaa nke Julai.
Mmadụ abụọ a na-ebo ebubo, (ya bụ Ike Ekweremadu na nwunye ya) ga-anọgodu na mkpọrọ ndị uweojii ruo ụbọchị ahụ.
A nwụchiela Ike Ekweremadu na nwunye ya na mba UK

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
A nwụchiela Ike Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice Nwanneka na mba UK maka ebubo na ha chọrọ ịghụrụ ime ahụ nwatakịrị.
Ekweremadu bụ sinetọ n'ụlọomeiwu Naịjiria, na nwunye ya ga-agba n'ụlọikpe Uxbridge Magistrate Court, ebe a ga-ekpe ha ikpe maka ihe Bekee kpọrọ 'organ harvesting'.
Ekweremadu dị afọ 60 na nwunye ya dị afọ 55, ga-azara ọnụ ha n'ụlọikpe taa bụ 23 nke ọnwa Juun.
A malitere inyocha ya dịka a kpọkuru ndị uweojii ka ha bịa nyochaa ebubo na ha mere mmadụ ohu, n'okpuru iwu a kpọrọ 'modern slavery legislation' e hibere n'ọnwa Mee afọ 2022.
Ndị uweojii Metropolitan Police nke mba UK kwuru na ha agaghị agbazị ihe ọbụla gbasara okwu a n'anwụ, dịka a maliterela ikpe ha ikpe.
Onye bụ Ike Ekweremadu?

Ebe foto si, Ike Ekweremadu/Facebook
- Ekweremadu bụ onye ọkaiwu
- Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọrọla n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria kemgbe afọ 2003 ruo ugbua, n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP)
- Ọ na-anọchi anya ndị Enugwu Westị n'ụlọomeiwu ahụ
- Ọ rụrụ dịka osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjiria ugboro atọ, site n'afọ 2007 ruo 2019
- Ọ rụkwara dịka onyeisioche okpuruọchịchị Aninri n'okpuru pati United Nigeria Congress Party (UNCP) n'afọ 1997
- Ọ rụkwara dịka onyeisi ndị ọrụ gọvanọ Enugwu steeti site n'afọ 1999 ruo 2001. E mechara mee ya odeakwụkwọ gọomentị Enugwu steeti site n'afọ 2001 ruo 2002
- A mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee afọ 1962
- Ekwere mmadụ bụ onye obodo Amachara-Mpu nke dị n'okpuruọchịchị Aninri dị n'Enugwu steeti
Gịnị bụ 'organ harvesting'?

Ebe foto si, Getty Images
'Organ Harvesting' maọbụ 'organ procurement' bụ iwere akụkụ ahụ mmadụ iji tinyere onye ọzọ.
Usoro e si etinyere mmadụ akụkụ ahụ onye ọzọ bụ nke bekee na-akpọ 'organ transplant'.
Akụkụ ahụ ndị a nwere ike ịbụ akịrị (kidney); umeji (liver), ngụgụ (lungs), dịrị gawazie.
E nwere ụzọ dị icheiche e si enweta akụkụ ahụ ndị a n'ụzọ iwu kwadoro.
Ha gụnyere: mmadụ inye ikike ka e were akụkụ ahụ ya ma ọ nwụọ, maọbụ mmadụ iji aka ya wepụta onwe ya ka e were akụkụ ahụ ya tinyere onye ọzọ.
Mana e nwekwara ndị ekperima na-atọrọ mmadụ ma were akụkụ ahụ ha n'ike iji ya kpara ego, a na-akpọ nke a 'organ theft' na bekee.
E nwekwara ndị na-eji aka ha ga ree akụkụ ahụ ha iji nweta ego, nke bụ 'organ trade' na bekee.
Iwu mbaụwa machiri 'organ theft' mana na mba ụfọdụ, mmadụ iji aka ya ere akụkụ ahụ ya emegideghi iwu.








