Fr. Mbaka atụgharịala duru ndị nsonso ya na ngagharịudo ikwado Bishop Onaga

Aha onyonyo, Fr. Mbaka atụgharịala duru ndị nsonso ya na ngagharịudo ikwado Bishop Onaga

Na-erughi otu izu o kwuru na ọ maghị ihe ọbụla banyere ngagharịiwe ndị nsonso ya mere n'ụlọọụka ya, Fada Ejike Mbaka atụgharịala duru ha na ngagharịudo.

Fada Mbaka na ndị nsonso ya mere ngagharịudo a iji gosi nkwado ha n'ebe bịshọpụ Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga, nọ.

Ntụgharị a na-abịa dịka ndị nsonso Adoration Ministry Enugwu, bụ ụlọụka Fada Mbaka, mechara ngagharịiwe n'ụbọchị ụka, ebe ụfọdụ n'ime ha nọ na-ekwu sị "Onaga ga-apụrịrị".

Fada Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria/Facebook

Fada Mbaka n'ụbọchị Wenezde, 22 nke ọnwa Juun afọ 2022, duuru ndị nsonso ya bịara n'ụlọụka Adoration, na-agwa ha ka ha laghachị n'ụlọ ha n'ihi na ha ekwesịghị ịka ụka ụbọchị ahụ.

Ọ gwara ha sị na ọ chọghị ka onye ọbụla kparịa Bishọp Onaga ọzo, na ọ chọrọ ka onye obula na-ekwu naanị ihe ọma gbasara Bishọp.

O kwuru sị na ọ ka bụkwa ụkọchukwu ụka Katọlik, nke bụ na ọ gaghị nupuru bishọpụ ya isi.

O kwuru sị "Ịkparị Bishọpụ m bụ ịkparị m...na-ekpere anyị ekpere, kpeere m ekpere, kpeere Bịshọpụ ekpere.

"Kpeere Peter Obi ekpere. Ọ bụ nwanne anyị. Ọ bụ nwa anyị.

"Ka anyị chebiri ihe ụka ga-agwa anyị mee. Anyị agaghị agbakọzị ebe a (Adoration ground) ruo mgbe e kpebiri.

"Unu akparịzịla Bishọpụ na soshal midia. Anyị na Bishọpụ anyị enweghi nsogbu."

Ọ malitere ịgụpụta ihe ndị mmadụ dere n'akwụkwọ ha ji eme ngagharịudo, nke gosiri ihe ọma dị iche iche ha dere maka Bishọp. Cheta na e dechara okwu ọjọọ na ndị nke ha ji mee ngagharịiwe mbụ.

Ndị Adoration ji ohere ahụ na-arịọ Bishọp Onaga arịrịọ mghaghara maka ngagharịiwe ha mere, ma rịọ ya ka ọ hapụkwa ka ụka Adoration malitekwa ọzọ.