Aka m adịghị na ngagharịiwe e mere n'Adoration ụnyaahụ - Fada Mbaka

Fada Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Facebook

Fada Ejike Mbaka agọrọla ụkwụ na aka ya na ngagharịiwe e mere n'ụlọụka ya bụ Adoration Ministries, Enugwu, n'ụbọchị ụka, 19 nke ọnwa Juun 2022.

Fada Mbaka onye binyere aka n'ozi e ziputere na Facebook ya, kwuru sị na enweghi etu ọbụla o si sonye na ya bụ ngagharịiwe nke ndị bịara ụka n'Adoration Ground mere.

Ọ gara n'ihu kpọkuo ndị ụlọụka ya ka ha dere jụụ ma kwụsị mkparị ha na-enye Bishọpụ ya bụ Most Rev. CVC Onaga.

O kwuru na Adoration Ministries nọ n'okpuru ma na-erubere ụka Katọlik isi, ma kwuo ka ụmụ Adoration mara nke a.

Fada Mbaka gara n'ihu kwuo na ọ na-erubere Bishọpụ ya isi, ma gwa ndị Adoration ka ha gbaa mbọ na-aga maasị mgbe ọbụla.

Lee ozi o binyere aka:

Akwụkwọ ozi o ziputara

Ebe foto si, Adoration Ministry Facebook

Akwụkwọ ozi o ziputara

Ebe foto si, Adoration Ministry Facebook

Ihe mere Bishọpụ Enugwu ji machie emume n'Adoration

N'ụbọchị 18 nke ọnwa Juun ka Bishọp ụka katọlik nke Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga, nyere iwu sị ka ndị ụka Katọlik kwụsị ife ofufe n’Adoration Ministry nke Fada Mbaka.

Bishọpụ nyere iwu a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị 17 nke ọnwa Juun, 2022, sị na mmachi a ga-adị ruo mgbe e mechara nnyocha ndị isi ụka Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka.

Ọ gara n'ihu kwuo “N’ihi ọtụtụ ihe ndị na-eme n’Adoration Ministry nke megidere okwukwe na nkuzi ndị Katọlik; a dọọla Fada Mbaka aka na ntị ọtụtụ oge mana o geghi ntị na ntuziaka ndị a.”

Mmachi a na-abịa n’ụbọchị ole na ole Father Ejike Mbaka buru amụma sị na Peter Obi ji aha Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala agaghị emeri maka na ọ bụ onye aka ntachi.

Amụma a Fada Mbaka buru mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbarụọ ihu ma katọọ ya n’ụzọ dị iche iche.

N’ihi nke a Mbaka wepụtara ozi n’ụbọchị Fraịde 17 Juun, sị na ọ gọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara.