Peter Obi enweghi ike ịbụ onyeisiala Naịjiria - Fada Mbaka

Peter Obi na Fr Mbaka

Ebe foto si, Peter Obi/Fr Mbaka

Ụkọchukwu Katọlik a ma ama bụ Ejike Mbaka ekwuola na Peter Obi agaghị abụnata onyeisiala Naịjirịa.

Fada Mbaka bụ onyeisi ụlọ ekpere Adoration Ministry Enugu, kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere o mere n'ụlọ ekpere ya taa bụ Wenezde, abalị iri na ise nke ọnwe Jun afọ 2022.

Cheta na Peter Obi, bụbu gọvanọ Anambra Steeti, bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Party'.

Mbaka kwuru na Peter Obi bụ mmadụ na-enweghị mmụọ inye mmadụ ihe, ma kwukwa na "onye aka 'gum' agaghị abụnata onye ndu Naịjirịa".

"Ọ ka mma inwe onyeisiala bụ agadi nwoke nwere mmụọ onyinye, karịa inwe onye ntorobia nwere aka 'gum'."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Abubakar Atiku - onye na-azọ ọkwa onyeisiala na Pati PDP - egosila na ọ dịla njikere ịzọ ya bụ ọkwa n'ihi na ya na Peter Obi akwụghịzi.

"Peter Obi nwere abụmọnụ ọnụ, onweghị ebe o ji azụ aga...ma ọ bụrụ na ọ bịaghị sekpuru ala n'elu 'altar' Adoration." Mbaka kwuru.

Gere ihe Fada Mbaka kwuru n'onyonyo a

Aha onyonyo, Fr Ejike Mbaka: Peter Obi enweghi ike ịbụ onyeisiala Naịjiria

Mbaka kwuru na Peter Obi kparịrị mmụọ nsọ.

O kwuru na ọ bụ ya nyeere Peter Obi aka ịlọghachi n'ọkwa Gọvanọ n'Anambra steeti, "mana ọ bịaghị bịa kelee Chukwu".

"Onye anaghị eri ego ya eri ka ụnụ na-achọ ịkwado? Ụnụ ọ chọrọ ka agụụ gụgbuo ndị mmadụ?"

"Ọ bụrụ onyeisiala, ọ ga-emechi mịnịstrị anyị."

"Ọ bụrụ na ndị Igbo na-achọ onye ga-anọchite anya ha na Naịjirịa, ọ bụghị ụdịrị mmadụ Peter Obi."

Mbaka kwukwara sị: "Onye jụrụ inye onyinye n'ụlọụka o kwesịrị ịbụ onyeisiala?"

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ otu a ka Peter Obi si hapụ APGA mabanye PDP, n'agbanyeghị enyemaka niile Odumegwu Ojukwu nyeere ya iji bụrụ gọvanọ.

"I (Peter Obi) ji Ojukwu wee bido, n'etiti n'abọ ị tụhapụ Ojukwu, tụhapụ Igbo bụ Igbo, tụhapụ APGA, banye PDP," Mbaka kwuru.

"Ugbua ọ gbabala na Labour (Party), ime emewela ya na 'Labour'."

"Ọkwa ị ma na onweghị ihe ụmụakwụkwọ kpọrọ asị ka 'labour'...onye ọbụla kwadowe labour'."

"Ọ bụrụ na o si na APGA were azọ ọkwa a, anyị amara na o nwere ndị ọ na-anọchi."

Ihe Mbaka kwuru maka Peter Obi n'oge gara aga

Fr Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria - AMEN

Nkọwa foto, Fr Mbaka
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'afọ 2018, dịka Abubakar Atiku na Peter Obi na-achụ nta Mbaka kwuru na ihere ga-abụ nke ha n'ihi na Peter Obi na-emere Chineke aka 'gum'.

Mbaka kwuru nke a n'emume 'harvest' nke ụlọ ekpere ya mere n'afọ ahụ.

Peter Obi na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ gara ya bụ emume, mana Peter Obi ekweghị akpọ aha ego, kama o kwuru na ya ga-ahọrọ otu ihe ya ga-emere ụlọụka Mbaka.

Mana Mbaka kwuru na ihe ahụ Peter Obi mere bụ mkparị nye Mmụọ Nsọ Chukwu.

O kwukwara na Atiku na Peter Obi ga-ada ntuliaka ahụ n'ihi na Obi enweghị mmụọ onyinye.

Fada Mbaka mechara rịọ Peter Obi mgbaghara maka ihe ahụ o kwuru gbasara ya, mana dịka ọ na-ekwu okwu taa bụ Wenezde, abalị iri na ise nke Jun 2022, o kwuru mgbaghara ahụ ọ rịọrọ esighi ya n'obi.

"Arịọrọ m Peter Obi mgbaghara n'ihi na Bishọpụ nyere m iwu ka m rịọ ya. Dịka ụkọchukwu Katọlik, iwu ji m irubere Bishọpụ m isi."

Mbaka kọwara na ihe mere n'ụbọchị ahụ na 2018 bụ na Peter Obi chọrọ ịnọrọ n'ime ụlọụka ya na-achụ nta vootu, mana ya ekweghị.

O kwuru sị: "Peter Obi chọrọ ka m nye ya ohere ka ọ nọrọ n'ime ụlọụka rewe ahịa ya na Atiku, mana ekweghị m."

"Ọtụtụ ndị pati APC, gụnyere gọvanọ Ganduje nke Kano steeti bịachara ebe a ụbọchị ahụ."

"Ọ bụrụ na Peter Obi bido ikwu okwu maka PDP, aga m enyekwa ndị ọzọ ohere ka ha bịa kwuo okwu maka pati ha?"

"Ụlọ nsọ Chineke abụghị ebe a na-ekwu okwu ndọndọrọ ọchịchị."