Anyị chọpụtara ndị omekome ụmụnwaanyị asaa n'ime ndị atọghapụrụ na mgbere - NAPTIP

Aha onyonyo, Anyị chọpụtara ndị omekome ụmụnwaanyị asaa n'ime ndị atọghapụrụ na mgbere - NAPTIP

Onyeisi NAPTIP n'Anambra steeti bụ Judith Chukwu agwaala BBC Igbo maka mmadụ 35 azọpụtara n'ụlọ akwụna dị n'Anambra.

O kwuru na ụmụaka anọ n'ime ndị a chọtara dị ime, ebe mmadụ itoolu gụnyere ụmụnwaanyị asaa bụ ndị omekome so tinye ndị ụmụaka n'ọnọdụ ha nọ.

"Ihe dị anyị mkpa ugbua bụ ị dozi ọnọdụ ụmụaka ahụ, anyị mechaa nke a, anyị e nwe ike malite nnyocha"

Ọ kọwara na ọrụ a si na njịkọ aka ngalaba nke ha bụ NAPTIP nakwa ndị uweojii na steeti ahụ.

"Anyị ga-eme ka ezinaụlọ ha (ndị atọghapụrụ) mara ma anyị hazichaa ma mechaa ha nyocha" ka o kwuru.

Ụmụaka e ji agba mgbere akwụna n'Anambra

Ebe foto si, Anambra Police

Ndị uweojii Anambra Steetị sị na ha siri imi n’ala ma chọpụta ogige ebe a na-eji ụmụagbọghọ agba akwụna, edina ha nakwa e ji ha akpụ ụmụaka.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, sị na nke a mere n’ụbọchị Mọnde 13 Juun, 2022.

Ụmụaka a tụrụ mgbere akwụna

Ebe foto si, Anambra State Police

Ọ sị na site na kepukepu na nyocha ha mere ka a chọpụtara ụlọ ndịna a kpọrọ ‘Gally Gally dị na Nkpor ka e ji ụmụ nwaanyị ndị a atụmgbere akwụna.

Ikenga sị na ha zọpụtara ụmụnwaanyị iri atọ na ise (35) nọ na-agbata afọ iri na anọ ruo iri na asaa (14yrs-17yrs).

Ọ sị na mmadụ anọ n’ime ụmụnwaanyị ndị a dị ime ebe ha nwuchiri mmadụ atọ a na-enyo na aka ha dị na arụ a.

Ndị a gụnyere; Ifeoma Uzo dị afọ iri na ise (35yrs), Chidiebere Alaka dị afọ iri abụọ na asatọ (28yrs) na Nweke Chidiebere.

Ọ gara n’ihu sị na ha kpachiri egbe ‘pump action’ atọ, mgbọ egbe asaa nakwa ego dị puku narị naịra asatọ na puku iri asaa na asaa na narị ise (N877,500).

Ụmụaka a tụrụ mgbere akwụna

Ebe foto si, Anambra State Police

“Dịka ọ dị ugbua a malitela inyocha ndị a nwuchiri ịmata ka ha aga enye aka ịchọpụta ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ” - Ikenga kwuru.

“Anyị ga-enyefe ụmụaka ụmụnwaanyị ndị a n’aka ndị National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) maka ilebara ha anya nakwa inwogharị ha.

Ikenga sị na a ga-akpụpụ ndị a ha jidere n’ụlọikpe ma ha mechaa nyocha.

Ndị a nwuchiri e chere na-atụ mgbere ụmụaka

Ebe foto si, Anambra State Polce