Etu ndị 'baby factory' si eme ka nwaanyị tụrụ ime adigboroja

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ eziokwu na ịmụta nwa baara uru n'ezinaụlọ ọbụla, ọ bụ isi isekpuntị dị n'alụmdinanwunye.
Mana etu ọtụtụ ezinaụlọ si achọsi nwa ike ugbua na-edubazi ha n'aka ndị aghụghọ maọbụ ịga zuo nwa onye ọzọ.
Ụlọọrụ na-ebuagha megide ịtụ mgbere mmadụ na Naịjirịa bụ 'National Agency for Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP)' tinyere ọnụ n'okwu banyere nke a.
Onyeisi ụlọọrụ a nke ngalaba Legọs bụ Aganran Ganiu kọwara usoro ọhụrụ ndị na-atụ mgbere ụmụaka ji aghọ ezinaụlọ na-achọ nwa aghụghọ.
Ganiu sị na ndị na-enwe ụlọ ebe a na-edosa ụmụagbọghọ ka ndị ntoroọbịa tụwa ha ime iji mụta ụmụaka ha ga-ere ere.
Ọ sị na ọ bụrụ na nwaanyị na-achọ nwa bịa n'ụlọọgwụ ha, ha ga-ekwe ya nkwa ime ka ọ mụta nwa.
Ha ga-enye nwaanyị a ọgwụ ma sị ya gbalịa hụ na ya na di ya nwere mmekọ ka o nwee ike tụrụ ime.
N'ihe dịka ọnwa ole na ole, ọgwụ ahụ ga-eme ka afọ nwaanyị a na-eto ka ọ tụrụla ime, ọnọdụ ahụ ga-agbanwekwa ka nke onye dị ime.
N'otu aka, ahụ ndị a ga-agba mbọ hụ na otu nwagbọghọ ọzọ nọ n'ụlọọgwụ ha a ga-adị ime ka e nwee ike kunye ya nwaanyị ahụ.
Ha ga na-atụle nwagbọghọ ahụ iji mara mgbe ime ga-eme ya, n'otu aka ahụ, a ga-eme ka ime mewekwuo nwaanyị a na-achọ nwa.

Ebe foto si, Getty Images
A ga-akpọba nwaanyị a n'ime ụlọ imụ nwa ma gbaa ya ọgwụ nke na ọ gaghị ama onwe ya, mana o teta ha kuru nwa nwagbọghọ ahụ kunye ya.
Nwaanyị a ga-eche na ọ mụọla nwa kama ọ gaghị ama na nwa ọhụrụ abụghị nwa ọ mụrụ n'afọ ya.
Ganiu sị na ọtụtụ ezinaụlọ adabala n'aka ndị na-amaghị na nwa a sị nwunye mụrụ abụghị nke ha.
Ọ sị na ụfọdụ na-achọpụta ma ọ bụrụ e nwere etu ha si chọrọ ime njem n'ofesi a sị ka e mee nyocha 'DNA'.
Ganiu sị na ụdị ndị a jupụtara na mpaghara Ọwụwanyanwụ na mbụ mana ugbua ha zuola Naịjirịa ọnụ.
Ọ sị na ndị ọrụ ha na ndị ọrụ nchekwa anwụchiela ụfọdụ ndị a site na kepu kepu nakwa ama ndị mmadụ gbaara ha.
Ọ sị ha ka na-arịọ ka ndị mmadụ na-agbara ha ama ụfọdụ ebe ndị dọkịta adịgboroja a nọ iji nye aka nwuchie ha.














