Maternal mortality: Ihe nwere ike ibute ọnwụ nwaanyị mụrụ nwa n'ụlọ

Nwaanyị na-amụ nwa

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dọkịnta Osita Umeononiru bụ ọkanmụta n'ahụike ụmụnwaanyị akọwala na oriakụ na ihe nwereike ibute ọnwụ Nkechi Chidi bụ onye nwụrụ dịka ọ na-amụ nwa n'ụlọ bụ oke ịgba ọbara.

Ndị uweojii Ebonyi nwụchiri otu nwoke a kpọrọ Samuel Chidi maka ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ụdọ mgbe nwunye ya nwụrụ dịka ọ na-amụ nwa n'ụlọ ha dị n'Abakaliki na nso nso a

Na nkọwa ya, Dọkịnta Osita Umeononiru sịrị, "Ọ ga-abụ na nwaanyị ahụ mụchara nwa, ọ bụrụ na ihe na-eso nwa apụtaghị, nke mere ọbara ji gbaa ya ebe ọdị ukwu."

"Ike ga-agwụ ya, arụ ya ajụọ oyii, ọ bụrụ na o ruteghi n'ụlọọgwụ n'oge, ọ ga-akpata ọnwụ."

Dọkịnta ahụ kọwara na ọ bụrụ na a wabuola nwaanyị ahụ afọ maka ịmụ nwa dịka akụkọ na-efegharị siri kwuo, o kwesighi ka ime mee ya tupu ọ mụọ nwa.

"Nke a bụ n'ihi na akpanwa ya nwereike ịgbawa oge ime na-eme ya."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyị bụ Loveth Odah gwara BBC Igbo na ndị otu ha nwuchiri nwoke ahụ iji gbochie ndị ezinaụlọ nwunye ya imerụ ya ahụ maọbụ gbuo ya n'ihi iwe.

"Ọ bụghị maka okwu igbu ọchụ, ọ bụ elezighi anya ka e ji nwuchie ya."

" Ihe onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ jiri nwuchie ya bụ ka ndị obi adịghị mma maka ihe mere ghara ikugbu ya."

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na a hụrụ ka nwoke ahụ na onye na-anapụta nke adịgboroja na-agbalị ileta nwaanyị ahụ dịka ọbara juru ya ahụ.

Ndụmọdatọ maka ịgbalahụ nwaanyị ịnwụ n'ịmụ nwa

Aha onyonyo, Ihe nwere ike igbu nwaanyị na-amụ nwa-Dokịta

Lee ndụmọdụ Dọkịnta Umeononiru dụrụ ụmụnwaanyị dị ime na ndị ezinaụlọ ha:

1. Gaa ezigbo ụlọọgwụ debanye aha ma na-ahụ dọkịnta ndị maara nke ekwe na-akụ n'ụlọọgwụ.

2. Ọ bụrụ na i nweghi ego, gaa ụlọọgwụ nke gọọmentị.

3. Onye awaburula afọ n'oge mbụ, ga na-ahụ dọkịnta ọkachamara n'ahụike ụmụnwaanyị kwa mgbe.

3. Gbaara ndị na-ana nwa n'ụlọ ọsọ

Akụkọ ga-amasị gị: