UNICEF: Otu n'ime ụmụaka atọ a mụrụ na nkọrọ na-anwụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị UNICEF ewepụtala akwụkwọ ozi site n'aka onye na ekwuchitere ha ọnụ bụ Pernille Ironside.
Ha kwuru na ụmụaka ruru puku nari atọ na ụma (300,000) ga-awuchi n'uwa a n'ụbọchị izizi afọ ọhụrụ.
N'ime ụmụ ọhụrụ na-abata uwa, ụmụaka puku iri abuọ na ise na ụma (25,000) ka a ga-amụ na mba anyi bụ Naijịrịa.
Etu okwu a siri wee gbasa anyị karịa bụ na ha kwukwara na otu n'ime ụmụaka atọ amụrụ na ala anyị na-anwụ n'ihi na ụmụnwaanyị na aga na nkọro amụ nwa.
Lee ụfọdụ n'ime ebe ndị a ụmụnwaanyị na aga amụ nwa.
1. Mama Ijaw

Ebe foto si, Getty Images
Ebe a bụ ebe n'adịkebe n'ogbe, ebe ụmụnwaanyị na-aga ka nwaanyị n'aghọ nwa hịaa ha aka na akpa nwa.
Obụrụ na achọpụta na nwa kpodoro isi na ala n'ime afọ, mama Ijaw ga eji aka ya were tụgharịa nwa ahụ n'ime afọ nne ya.
Ụlọ Ekpere

Ebe foto si, AFP
Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere okwukwe na ọ bụ naanị n'ụlọ ekpere ka ha ga amụnwu nwa ha n'udo. Ha na akwakọrọ jee ebe ahụ ka ekpewere ha ekpere ruo oge ọmụpụtara nwa ya.
Ụlọ nke ha

Ebe foto si, Getty Images
Onwere ụmụnwaanyị bụ na ọbụrụ na ha amụghị nwa n'ụlọ ha, ọpụtara na onweghị ebe ọzọ ha ga amụnwụzị ya.
Ime mewe ha, nne ha maọbụ onye ọzọ katagoroahụ ga-abịa be ha, mụọ ha nwa.
Ọmụmụ Ndaba

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ụmụnwaanyị anaghị aga ụlọọgwụ, ya bụ na ha amaghị mgbe ọ bụ oge ha ịmụ nwa.
Ọ na adabara ụfọdụ ndị na ahịa, n'ime ụgbọala, n'ụlọọrụ, n'ugbo, n'ụlọụka wee dịrị gawa.
Ebe ọbụla ime mewere ha ebe ahụ ka ha ga-amụ nwa.
Mana Doktọ ahụike ụmụnwaanyị akpọrọ Ebuka Akaghara kwuru na ọ dịghị mma ka nwaanyị na-aga ebe na-abụghị ụlọọgwụ ga-amụọ nwa.
O kwuru na ndị dibia Igbo enweghị akurungwa pụrụiche ha ga-eji gbochi ụfọdụ ọdachị na-adapụta dịka oke mmefu ọbara, maọbụ igwe eji echekwa nwa amụkworo amụkwọ.
Gere ihe okwuru n'uju ebe a.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:












