Jair Bolsonaro abanyela ọchịchị dịka onyeisiala mba Brazil

Ebe foto si, Getty Images
E duola onyeisiala ọhụrụ mba Brazil bụ Jair Bolsonar, n'iyi ọrụ n'isiobodo ha bụ Brasilia.
Ndị na-akwado Bolsonar bụ onye bụbu onye agha, kwuru na ha na-ele anya "mgbanwe o kwere na nkwa" mana ọtụtụ na-atụ egwu na ụdịrị ọchịchị ya nwere ike ibutere ndị Brazil ahụhụ karịa nke ha nọ na ya.
US emechiela ụlọọrụ ha dị na Naịjirịa

Ebe foto si, Twitter@USembassyAbuja
Mba Amerika emechiela ụlọọrụ ha dị na Naịjirịa bụ nke dị n'Abuja na Legọs ruo mgbe amaghị ama.
Dịka ozi ha dere na ọbaozi Facebook, ha kwuru na mmechia sitere na n'ihe na-eme na mba ha.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Gọọmentị mba Amerika mechiri emechi kemgbe 22 Disemba 2018 maka na ha ekwọrịtabeghị maka ego Onyeisiala Trump na-ana iji rụọ mgbaaja Mexiko.
Dịka BBC Pidgin dere, ụlọọrụ US na Naịjirịa ga-emeghe ma ekpebie okwu gbasara ego ya bụ mgbaaja n'obodo ha.
Agbanyeghị na ndị ọrụ ha arụtụghị aka ebe ahụ, mmechie bụ ezigbo ọgbatauhie nye ndị niile akpọrọ oku maka akwụkwọ ikike ha.
Ka ọ dị ugbua, ya bụ mmechị emetutela ọtụtụ ihe na mba US dịke ọtụtụ ụlọọrụ mechirila emechị, ndị njem enweghị ike ime njem, ndị ọrụ anataghị ụgwụ ọrụ ha.
N'akụkọ ọzọ,

Ebe foto si, AFP
Ndị gọvanọ steeti iri na isii dị na Naịjirịa ekwuola na onweghị mgbe ha ji kwu na ha achọghị ịkwụ ego opekatampe ruru puku nari naira atọ kama na ha ga-akwụli puku nari naira iri abụọ na ọma.
Ọ bụ Abdulrazaque Bello-Barkindo bụ ọnụ na-ekwuchitere ha kwuru nke a n'ụlọ ọrụ ha ụnyahụ.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Dịka abanyegoro afọ ọhụrụ, ndị mmadụ na-eche kedụ ndị egwuregwu bọọlụ a ga-ere na ndị a ga-azụta. Paul Pogba, Isco na Adrien Rabiot so na ndị ha kpụ n'ọnụ.
Akụkọ ga-amasị gị
Nkeji nke taa
IIhe nkiri











