Canada etinyela iwu ga-eme ka ọ siere ndị Naịjirịa ike ịga mba ahụ

Kanada na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọkaikpe ndị kanada sị ndị be ya na-emegbụ ndị Niajịrịa

Mba Kanada etinyela iwu ọhụrụ maka ndị Naịjirịa batara mba ahụ maka ọsọ ndụ.

Iwu a ga-eme ka ọhịa ahụ ịnweta ohere banye Kanada, mana ụfọdụ ụmụ Naịjịrịa si US gbaba Kanada ọsọ ndụ enwetere nkwado ndị ọkaikpe ụfọdụ na mba ahụ.

Ndị ọkaikpe a kwuru na agwa gọmenti ala ha na-akpasọ ndị Naịjirịa a gbatara ọsọ ndụ be ha jọgbụrụ ụdele ma sịgbuo nkakwụ.

Ọtụtụ ndị Naịjịrịa si ogige oke ala ndị US piofere kanada n'ihe ruru ọnwa iri na asatọ, bụ ebe ha chọrọ enyemaka ikike dịka ndị gbatara ọsọ ndụ.

Ihe kpanitere mbuso ndị ọkaikpe a kpọrọ onwe ha Canadian Association of Refugee Lawyers bụ agwa akpasara otu nwaanyị Naiịjrịa chọrọ iji ọsọ agbalahụ ịbe ugwu nwaanyị na be ha.

Ndị ọrụ okwu ndị gbara ọsọ ndụ dị n'aka bụ Immigration na Refugee Board (IRB) nke Kanada sị na ya bụ nwaanyị etozughị ịnye akwụkwọ ikike maka na-okwesiri ịgbaga ya bụ ọsọ ndụ na mpaghara ebe ndị ọzọ na Naịjịrịa dịka Ibadan maọbụ Pọtakọtụ.

Ndị otu ikpe mkpegharị IRB kpebiri na ya bụ ikpe bụ ịhe a ga-eji elegara anya na-ikpebị ikpe ndị ọzọ gbasara ndị si Naịjirịa gbata ọsọ ndụ bido ụgbụa gawazịa.

Ndị ọrụ IRB enwebuola ụdị mkpebị a na isi ndị mba China, India nakwa Pakistan.

Ndị otu Canadian Association of Refugee Lawyers na-eche na-iwu a ga-eme ka ihe tawanyega akpụ nye ndị sị Naịjirịa gbata ọsọ ndụ karịa ka ọ dị na mbụ.

Naịjirịa na Kanada

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lorne Waldman bụ ọkaikpe na Kanada

Onye ọkaikpe Lorne Waldman gwara ndị ntaakụkọ Reuters na olu sụpịrịsụpịrị na "ya bụ mkpebi ezighiezi maka na ọ ga-eme ka ihe siere ndị ụfọdụ ike karịa ibe ha bụ ndị sị mba ọzọ".

N'ezia, Kanada na ihe na-eme kemgbe afọ 2017 bụ mgbe ndị mmadụ bidoro siwe azụ ụlọ US piobatawa mba ahụ.

Ihe karịrị mmadụ 30,000 epiobatala Kanada kemgbe ahụ dịka akwụkwọ ndị gọmmenti mba ahụ kwuru.

N'ime ndị a, mmadụ 10,000 si Naijirịa nke ndị Kanada nabatara pesentị 33.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị