Ohaneze: 'Ipob bara nnukwu uru na Naịjirịa'

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-achịkọta Ohaneze ndịgbo na Lagos bụ Nnamdi Nwigwe akatọla etu ụlọikpe si kpọchịe ụmụnwaanyị 114 na nga maka ngagharị iwe ha mere n'Owerri, Imo steeti.
Nwigwe kwuru na o bụrụ na ndị ọnụ na-eru n'okwu dika ndị Igbo nọ n'ụlọomeiwu ukwu na ndị gọvanọ di iche iche tinye ọnụ n'okwu a, na a ga-akpọpụta ụmụnwaanyị ahụ.

Ebe foto si, Nnamdi Nwigwe
O kwuru na ha kwadosiri Ipob ike makana ha mere ka gọọmentị etiti gee ndị Ịgbo ntị.
N'onụ ya, "o nweghị ihe ga-eme ka ị kwụsị mmadụ ikwupute obi ya makana onye ọbụla nwere ihe na-emetuta ya."
"Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị ikwupụta maka ihe ọjọ a e mere ụmụnwaanyị a, ọ bụ ndị isi ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo kwesiri ị pụta kwụsị ya."

Ebe foto si, Getty Images
N'aka ọzọ, ndị ntorobia Ohaneze Ndigbo ekwuola na ha ga-egbochi nwakpo ọ bụla ga-esi n'aka ndị nchekwa Naịjirịa ma yọkwa onyeisiala ka ọdọ ndị nchekwa aka na ntị maka mkpagbu a.
Onyeisi ndị ntorobia a bụ Okey Nwachukwu kwuru na ndị ntorobia agaghị agbachị nkịtị ndị gọọmentị etiti a na-emegbu ndị Igbo.
Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ nsogbu na soshal midia:
@IPeoplesfamily depụtara ma sepụta foto ụfọdụ ụmụnwaanyi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@advantagetony sị na obi adịghị ya mma maka etu esi nwụchị ụmụnwaanyị a n'Owere, Imo steeti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@MrBoniface na-akatọ nwuchi a mana na-ayọ ka gọọmentị etiti tọghapụ ụmụnwaanyị ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3









