Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Wenger ga-eturu ugo n'aka George Weah

Akụkọ ndị dị mkpa

N'egwuregwu,

Arsene Wenger bụbụ aka chịkọtara otu bọọlụ Arsenal akwadola ị nara nturuugo n'aka onyeisiala mba Liberia bụ George Weah

Nke a bụ maka mbọ ọ gbara n'aka George Weah mgbe ọ na-ebido njem ya dịka onye ọgba bọọlụ na Yurope.

George Weah na Wenger

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, George nọbụ n'aka Wenger gbaa bọọlụ

Na ala Igbo

Biafra na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-achọ Biafra ka na ekwusi ya ike

Otu ụlọịkpe n'Owerri enyela iwu ka anwụchie ụmụnwaanyị ruru otu narị na iri n'anọ bụ ndị mere ngagharị iwe n'ụbọchị Fraide gara aga.

Ọkaịkpe S.K. Kadurumba kwuru na o nweghi ikikere ị tọghapụ ụmụnwaanyị ahụ ebe onye ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor nọchitere anya ha kwuru na ha ga-aga ụlọikpe ka nke ahụ iji kpeghari ya bụ ikpe.

Okwu nchekwa

Ndị agha

Ebe foto si, Getty Images

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Mansur Dan-Alli ekwuola na n'ezie, mkpa mkpa n'akpa na mpaghara ugwu Naịjirịa ka bụ ihe oke echiche.

O kwuru nke a dịka onyeisiala Muhammdu Buhari na ndị isi nchekwa ndị ọzọ nwechara nzụkọ imeụlọ ma kwuo na ha enwela mkpebi zuruoke maka ya bụ nsogbu.

N'Abuja

Ọkọlọtọ mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ ndị mba Amerịka na-ahụ maka ịbata mba ahụ n'Abuja ebiodola ọrụ ịnye ndị mmadụ akwụkwọ njem ("Visa" na Bekee) eji aga mba ahụ.

Cheta na n'abali ole na ole gara na ha kwuputara na ha ga-akwụsị ịnye ya bụ akwụkwọ ma ruo ugbua tụgharịa obi ha.

Ha ekwughi ihe mere ha ji nwee mkpebia a na mbụ mana ha kwuru ihe adịla ka ọdị na mbụ na ebe ahụ.

Na mba ofesi

Ego Venezuela

Ebe foto si, AFP

Ụlọakụ ndị agha Bolivia abụla ụlọakụ mbụ bidoro iji ego ọhụrụ mba Venezuela eme ihe.

Onyeisi ụlọakụ ahụ depụtara ya bụ ozi n'akara Twitter ya na ha ewugharịala atụmatụ ego ma nabata ego ọhụrụ ahụ

Venezuela wepụtara ego ọhụrụ maka ego ha daara nke ukwuu.

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Naịjirịa kwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị - Moghalu