Ọkaiwu Trump agbarala ya ọnya ogwu

Michael Cohen

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Maazi Cohen kwuru mbu na ya nwereike nwuọrụ Trump, mana ugbua, onya ịgwe ka ọd oor o ya n'ụzọ

Onye bụbu ọkaiwu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aha ya bụ Michael Cohen ekwetara na aka ya dị na mpụ emere mgbe ha na-azọ ọchịchị n'afọ 2016.

Cohen gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ Onyeisiala Trump ziri ya ozi oji mee ya bụ mpụ banyere ịmetọ iwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ihe Cohen kwuru na ya mere metụtara ụgwọ ọ kwụrụ otu nwaanyị na-eme ihe nkiri akwam iko.

Cohen, bụ aka ikenga Trump tupu aka kpara ya, kwetara na aka ya dị na nrụrụaka dịkwa n'ịghọgbu ụlọakụ, na ụtụ obodo nke Bekee kpọrọ tax.

Stormy Daniels na Karen McDougal

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwanyị abụọ a boro Trump ebubo na ọ kwara ha iko ma kwụọ ha ụgwọ ka ha mechie ọnụ

Onye ọzọ rụrụ Trump ọru na nkwado ntuliaka nke 2016 ahụ aha ya bụ Paul Manafort gara n'ihu ọkaikpe ebe a mara ya ikpe ọnụ asatọ n'ime ebubo iri na asatọ e boro ya.

Trump ka ọ na-aga njem

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Trump ekwughi ihe ọbụla maka Cohen, mana ọkatọrọ ikpe amara Manafort

Ụfọdụ n'ime ikpe ndị a mara Manafort gụnyere akwụghị ụtụisi ka o si kwesi na iji aghụghọ zuo egọ ndị ụlọakụ.

Cohen kwesiri ị ga mkpọrọ ruo afọ iri isii na ise mana arịrịọ ọ rịọrọ mgbe o kwuru eziokwu dị ya n'ọnụ ga-eme ka-enye ya afọ ise na ọnwa atọ.