Ọṅụ juru Amerịka, Kanada na Mekziko obi taa - Iko Mbaụwa 2026

Ebe foto si, Reuters
Mba Amerịka, Kanada na Mekziko ga-ejikọ aka ọnụ hazie ma kwaa ọbịa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2026.
Nke a pụtara taa na Rọshịa ebe a na-eme asọmpi Iko Mbaụwa 2018.
Mba ndị ahụ meriri mba si Afrịka bụ Moroko, iwere ohere ahụ.
Mba atọ ndị a jikọrọ aka ji votu 134 merie ndị Moroko bụ ndị nwere votu 65.
Ya bụ Iko Mbaụwa nke 2026 ga-abụ ọkacha n'Iko Mbaụwa maka na mba 48 ga-etinye ọkpa na ya bụ otu ịba na mkpụrụ ụbọchị iri atọ na anọ (34).
Nke a ga-eweta asọmpị iri asatọ (80) zuru ezu.
N'ọṅụ ya onyeisi egwu asọmpị dị n'aka bụ Carlos Cordeiro, sị na obodo atọ a "bụ otu n'ime egwu bọọlụ".
O kelere ndị mbaụwa maka ugwu a kwanyeere ha site n'inye ha ohere ịkwa ọbịa Iko Mbaụwa a.
N'ime mba 211 so na Fifa, 200 mere ntuliaka n'ọgbakọ nke 68 ha nwere na Mekziko taa bụ Wenezde, ebe a chọrọ ihe dịka 104 votu iji nwee meri na ya bụ ntuliaka.
Mba Gana esoghị na ya bụ ntuliaka maka mmachi gọọmenti ha machiri ha maka ebubo mpụ eboro ndị ọrụ ha.
Ụmụ obere mba so Amerịka dịka Guam, US Vegin Islandị na Puerto Rico esokwaghị mee ya bụ ntụliaka.
Cheta na Mekziko (1970 na 1986) na mba US (1994) akwabuola mbaụwa ọbịa Iko Mbaụwa a.

Ebe foto si, Getty Images









