New Years Day 2019: Etu Ị ga-esi mee ka afọ ọhụrụ baara gị uru

Ebe foto si, Getty Images
Oge ụfọdụ, ọtutụ mmadụ na-enwekarị mgbagwoju anya gbasara etu ha ga-esi mee ka afọ ọhụrụ ha mawanyekwuo mma karịa ka ọ dị n'afọ ndị gara aga.
N'ịme nke a, ụfọdụ n'ime ha na-adaba n'ọtụtụ ihe ize ndụ dị iche iche, bụkwazị nke na-emecha wetara ha ihe mkpọbi ụkwụ ebe ha na-eme ka afọ ọhurụ ha bụrụ nke mara ezigbote mma.
Lee ihe anọ Ị ga-eme ka afọ ọhụrụ a bakwuoro gị uru dịka ọka okwu n'a kpalite mmụọ ndị mmadụ bụ Linus Okorie si tụpụta:
1) Detuo ihe ndị gbara gị n'uche n'akwụkwọ:
Ọtụtụ oge, ụfọdụ ndị mmadụ na-echefukarị usoro dị mma bụ nke ha chepụtara iji mee ka ha nwee ezi afọ ọhụrụ bụ ịgba.

Ebe foto si, Getty Images
Iji gbanahụ nke a, gbaa mbọ hụ na echiche ọbụla gbara gị n'uche ga-abụ nke Ị ga-edetu n'ihu akwụkwọ.
Nke a ga-eme ka Ị nwee ike cheta ha mgbe oge ruru.
2) Tinye ya n'obi gị:
Gbaa mbọ hụ na ihe ndị ahụ I deturu n'akwụkwọ ga-abụkwa nke ị ga-etinye n'obi gị.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ ga-eme ka ị na-echeta ihe ndị a mgbe niile, ma mekwaa ka Ị na-arụsi ọrụ ike iji mezuo ha.
3) Tinye ya n'aka Chineke:
O kwere nghọta na ihe ọbụla e tinyere n'aka Chineke na-abụkarị nke echekwabara nke ọma.

Ebe foto si, Getty Images
N'ihi nke a, ka o ji dị oke mkpa ka echiche gị niile gbasara afọ ọhụrụ bụrụ nke ga-anọ n'aka Chineke.
Nke a ga-eme ka o nwee ike chekwaba ya, ma mekwaa ka afọ ọhụrụ a bakwuoro gị ezi uru.
4) Kwụwa aka gị ọtọ:
Mmadụ ọbụla kwesịrị ịkwụwa aka ya ọtọ n'ihe ọbụla ọ na-eme.
Nke a ga-enye aka wee mee ka ebumnobi Chineke kwadooro ya bụrụ ihe ga-erute ya aka.
Akụkọ ga-amasị gị:









