New year Message 2019 : Ihe ndị miri emi Buhari kwuru maka afọ ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka obi ụmụ Naijirịa dere duu maka ntuliaka na-abịanụ n'ihi na ọgaghị abụ tigbuo zọgbuo.
O kwuru nkea na ozi afọ ọhụrụ ozipuru ha.
N'okwu Buhari, "afọ 2019 dị ezigbo mkpa maka ọtụtụ ihe ga-emere Obodo Naịjirịa."
Ọ rịrịọrọ ka ụmụ Naịjirịa jiri ohere a wee tụgharịa uche na ihe ọma ole na ole mere n'afọ 2018 , nke ha nwetere na nke ha enweteghị ma were ohere ahụ kelee Chukwu.
Ihe ndị ọzọ o kwuru
- Afọ 2019 bụ afọ ntuliaka ebe a ga-ahọpụta ndị ga-azọta oche ọchịchị dị iche iche
- A na m ekwe nkwa na ntuliaka 2019 ga-akwụ ọtọ
- Ọtụtụ ndị na-azọ oche onyeisiala ekwetala ị mee ka udo chịa na ntuliaka na-abịanụ
- Ntuliaka ekwesighị ịbụ tigbuo zọgbuo ọkachasị n'ọchịchị onyekwuo uche ya
- Ndị na-ebu okwu ụgha na-emere onwe ha makana ụmụ Naịjirịa kwenyere n'anyị
- Anyi ga na-eme ka udo,akụ na ụba ,ezigbo nchekwa na ihe ndị ọzọ ga-enyere obodo aka tọọ atọ na Naịjirịa
- Naịjirịa ga-emeri nsogbu niile na-akpa ya
- Nye nụ anyị ohere ka anyị metọpụ ihe anyị malitere n'afọ 2015
- Anyị na ụnụ ga-eme ka Naịjịrịa kwudosie ike
Akụkọ ndị ga-amasị gị:





