Childbirth: Lee obodo anaghị ekwe nwaanyị dị ime mụọ nwa
N'obodo Mafi Dove dị na mba Ghana, anaghị ekwe ụmụnwaanyị dị ime mụọ nwa n'obodo ha.
Ha na-ahụta ya na ọ ga-emegide 'chi' ha.
Nke a mere ka ụmụnwaanyị dị ime na-eme njem tere aka, gawa obodo ọzọ ịmụ nwa ma ime mewe ha.
Mana ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ekwulite okwu na-asị ka a kachapụ omume a.
