Pregnancy Care: Ihe 10 ụmụwaanyị dị ime ekwesighi ime

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa & Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
Nwaanyị lụ ha na dị, ihe ọzọ ụwa na-atụ anya ya bụ afọ ime.
Nke a bụ makana nwa bụ ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ọbụla ọ batara.
Ngwa chọrọ mmanya juru oyi, nọrọ ala ka i gere ihe dọkịta Joseph Akinde na-ahụ maka ụmụnwaanyị di ime gụpụtara dika ihe nwaanyị dị ime ekwesighị ime maka ngaramara.
1: Inụ ọgwụ
Nwaanyị dị ime ekwesịghị ịnụ ọgwụ ọbụla belụsọ nke dọkịta ya tuziri ya.
2: Mmanya na-aba n'anya
Dọkịta Akinde kwuru na nwaanyi dị ime ekwesighị ịṅụ mmanya na-aba n'anya.

Ebe foto si, Getty Images
3: Gbara 'Akpoola' ọsọ
Nwaanyị dị ime ekwesighị na-eyi akpoola ya bụ akpụkpụ ụkwụ gbanitere elu. Dọkịta Akinde kwuru na nke a nwereike ịkwatụ nwaanyị dị ime ma metụta nwa o bu n'afọ n'uzọ na adịghị mma.
4: Ilụ Ọgụ
Nwaanyị dị ime ekwesịghị ilụ ọgụ.
Akinde kwuru na atụmaatụ nwereike ibute ọnwụ nne na nwa.Ọ mara atụ akụkọ mere eme ebe otu nwaanyị dị ime nwụrụ maka na nwa ya nwoke torola eto kụrụ ya aka n'afọ . Nke a metụtara akpa ebe nwa
nke mere ka ọbara gbagbuo nwaanyị ahụ.
5: Njem tere aka

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta Akinde kwuru na nwaanyị dị ime gafegoro ọnwa asaa ekwesighị ime njem tere aka.
Nke a bụ makana ime nwereike imewe ya n'ụzọ. Kedụ ihe ọ ga-eme?
6: Ise anwụrụ
Nke a adabaghị ma ncha. Dọkịta Akinde kwuru na anwụrụ ọkụ nwereike ime imetụta ụbụrụ nwa e bu n'afọ.
7: Imado afọ n'ala
Onye na-eme nke a? I chọrọ igbu nwa na-abịa ụwa?
Akinde kwuru na ọnọdụ ndina kachara nwaanyị dị ime mma bụ idina n'akụkụ kama ichewe afo ime ihu elu maọbụ mado ya n'ala.

Ebe foto si, Getty Images
8: Iri nri ahụ gị anabataghị
Nwaanyị di ime kwesiri iri nri ahụ ya nakwa nwa o bu n'afọ nabatara.
O rie nri ahụ ya anabaghị, ọ ga na-agbọ sọsọ agbọ. Nke nwereike na-ebute Ike ogwụgwụ.
9: Egwuregwu ụfodụ na-adịghị mma
Ọ bụghị mmeghariahụ (exercise) ka nwaanyị dị ime kwesiri i na-eme.
I ma atụ, dọkịta Akinde kwuru na ọdịghị ka nwaanyị dị ime na-agba ọsọ ima aka.
10: Nsori
Dọkịta Akinde kwuru na ọ bụrụ na nwaanyị di ime anaghị enwe ọpụpụ nwa, nsori na-adị mma.
Mana ọ dụrụ ọdụ ka ụmụnwaanyị di ime kwụsị nsori tupu izu ụka anọ ha ga-eji mụ nwa.











