Kidnapping: Aka ndị uweojii akparala onye so gbuo otu ụkọchukwu
Aka ndị uweojii akparala onye gburu ụkọchụkwụ

Ebe foto si, Getty/AFP
Aka ndị uweojii n'Imo steeti akparala otu onye ntọ ha sị na aka ya dị n'ogbugbu ụkọchụ Cyriacus Onunkwo bụ onye ha naara ndụ n'afọ 2017.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Olando Ikeokwu sị na aka kpaara ya bụ nwaamadị sagoro asịsa ka ọ na-agba nkwụ nwụye ọhụrụ ọ nụrụ n'Ajị dị n'Okpuru ọchịchị Oru East.
Ọ sị na Charles Nnanna so na mmadụ isii tọọrọ ya bụ fada bụ onye bịara ịkwa nna ya nwụrụ anwụ n'afọ ahụ
Dịka Ikeokwu kọrọ na ha chọpụtara na ya bụ ụkọchukwu nwụnahụrụ ha na-amaghị ama dịka ha kechiri ya imi na ọnụ ka ọ ghara itizi mkpụ n'ụzọ ka ha bụ ya aga.
" Ndị ntọ ahụ buuru ya banye imeọhịa ka ha kechie ya ọnụ ka ọ gharazị iti mkpụ, mgbe ahụ ka ha jiri kechikwuo ya ma ime mere fada ahụ ji nwụlahụ ha n'ụzọ".
Ikeokwu kwuru na Charles kọọrọ ha ka o sị gbaga Indonashịa bụ ebe ọ nọ ruo mgbe ọ latara ịgba nkwụ nwaanyị ya bụzị ebe aka nọzị kpara ya bụ ezekudele.
Ọ sị na ndị uweojii jideburu mmadụ ise ndị nke ọzọ ka ha mechere ya bụ arụ.
O kwukwara na ọ bụ ndị mgbaama ha nọ n'ime obodo gbaara ha ama maka nlọta ya bụ nwaamadị.
Ikeokwu jikwa ohere ahụ kpọkuo ọha na Eze ka ha tinye aka n'ịgbara ndị uweojii ama ndị omekome bị na ogbe ha.
Ndị uweojii na Delta na ndị ntọ

Ebe foto si, AFP
Ọzọ dịka ibe ya bụrụ na aka ndị uweojii na Delta steeti kpakwara ndị otu ha mmadụ anọ aka ha dị na ịtọhapụ onye ntọ isiabaokpu ha ji eji.
Onye kwuru nke a bụ onyeisi ndị uweojii na Delta steeti bụ Ikechukwu Aduba.
Akwụkwọ akụkọ na-akọwa na ndị uweojii ahụ naara onye omekome ahụ ego ha ji tọhapụ ya ka ọ gbafụọ.
Ndị uweojii ndị ntaakụkọ gbara ajụjụ ọnụ sị na ya bụ ihe ndị otu ha mere sigburu udele ma sigbuo nkakwụ.
Ọgụ na-ada n'etiti Sọmalịa na Kenya

Ebe foto si, Getty Images
N'Afrịka, ka ana ekwu ọzọ, ọzọ na-eme n'okeala Sọmalịa na Kenya dịka ọtụtụ mmadụ gbawara ọsọ ndụ ha maka ọgụ ndị agha mba abụọ ahụ na-alụ na Mandera dị na mpaghara ugwu mba Kenya.
Nke a na-abịa otu ụbọchị ka Ndịsiala mba abụọ ahụ bụ Uhuru Kenyatta nke Kenya na Mohamed Abdullahi nke Sọmalịa nwechere mkparịta ụka maka ịme ka udo chịa n'etiti mba abụọ ahụ.
Uhuru Kenyatta adọbụọla onyeisiala Sọmalịa aka na ntị maka "ọgbaghara na-enweghị isi" ha na-ebute.

N'egwuregwu

Ebe foto si, EPA
Ụmụibe, n'asọmpị Premier League taa Liverpool ejirila ọkpụ goolu abụọ chụlaa Bournemouth be ha bụ ndị ji otu ọkpụ zọrọr isi onwe ha.
Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Ebe foto si, Getty Images
Mịnịsta nta na-ahụ maka ahụike bụ Olorunnimbe Mamora ekwuola na ọdịghị mkpa ndị mmadụ itụfụ ego ha n'ịzụ akwa mkpuchi imi beke kpọrọ face mask n'ihi egwu coronavirus.
Mamora kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV n'ụtụtụ Satọdee.
Ọ kọwara na ndị kwesịrị ị na-eji akwa ahụ ekpuchi imi bụ ndị ọrụahụike maọbụ ndị nwere ọrịa coronavirus, ọbụghị mmadụ niile.
Mamora kọwara nke a n'ihi etu ndị na-ere 'face mask' ji bulie ọnụ egọ ya n'elu ọjị.
Ndị ntaakụkọ kwuru na a na-erebu akwa mkpuchi imi otu puku naịra maka mkpụrụ iri ise, ugbua, ọ bụzị puku naịra iri maka mkpụrụ iri ise.
Mịnịsta ahụ katọrọ etu ndị na-ere ihe ndị e ji egbochi ọrịa dịka akwa mkpuchi imi nakwa mmiri pụrụ iche e ji edobe aka ọcha bụ 'hand sanitizer' si bulie ọnụ ego ha n'ihi coronavirus.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Cameroon ekwuola na onye nke abụọ ebutela ọrịa coronavirus na obodo ha.
Mịnịstrị ahụike Cameroon kwuru na onye nke abụọ a na onye nke mbụ mekọrịtara ahụ.
Mmadụ abụọ ahụ bu orịa a nọzị ugbua n'ụlọọgwụ etiti dị n'obodo Yaounde.
Dkt Nanaouda Malachie bụ Mịnịsta ahụike nke mba Cameroon dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka obi ghara ịmapụ ha.

Ebe foto si, Cameroonian government
Nke a na abịa dịka a chọpụtara na mmadụ atọ a na-enyo enyo maka ọrịa coronavirus na Naịjirịa ebughị ya bụ ọrịa.
Ka ọ dị ugbua, naanị otu onye buterela coronavirus na Naịjirịa.
Nwoke ahụ bu onye ọcha si mba ịtali bata.
Na mba Itali

Ebe foto si, EPA
Na mba Ịtali, ọrịa coronavirus na-agbasa n'ike n'ike.
O gbuola ihe ruru mmadụ narị abụọ dịka ndị ngalaba ahụike mba ahụ si kwuo.
Ya bụ ọrịa abakwaala obodo Vatican, nke bụ ebe isi ụlọụka Katọlik dị.

Ebe foto si, Getty Images
Obodo ndị ọzọ ọrịa banyere n'ọdị nso a gunyere Serbia, Slovakia, Peru nakwa Togo.
E wepụ mba China bụ ebe ọrịa coronavirus si malite, ya bụ ọrịa na-akpakwa ike na mba South Korea na Iran.
Ọ bakwaala mba Amerịka nakwa Briten.
Na California

Ebe foto si, AFP
A chọpụtala ọrịa coronavirus n'ime mmadụ iri abụọ na otu nọ n'ụgbọmmiri a kpọrọ Grand Princess n'obodo California nke mba Amerịka.
Ihe karịrị mmadụ puku atọ na narị ise nọ n'ime ụgbọ mmiri a.
Osote onyeisiala Amerịka bụ Mike Pence kwuru na ụgbọmmiri ahụ ga-aga n'otue ebe dị anya ebe a ga-anọ nyochaa mmadụ niile nọ n'ime ya.
Etu coronavirus si metụta egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Coronavirus emeela ka a kagbuo ọtụtụ asọmpi na mba dị icheiche.
N'abalị Satọdee, mba Fransị kagburu asọmpị bọọlụ gaara ịdị n'etiti ndị PSG na Strabourg n'ihi egwu ọrịa ahụ.
Ha kagbukwara asọmpi ọsọ Paris Marathon nakwa asọmpi ịnya igwe a kpọrọ 'Paris-Nice Cycling'.
Asọmpi EPL

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ eziokwu na coronavirus abanyela mba Briten, mana ọdịbeghị oke njo ugbua.
Ọrịa emeela ka a kagbuo ọtụtụ asọmpi na mba Ịtali nakwa Fransị, mana ọ dịghị otu a na mba UK.
Otu egwu bọọlụ Liverpool na Bournemouth ga-amalite asọmpi English Premier League nke taa.
Ebe Arsenal na West Ham ga-achịpụkwa ya n'elekere atọ nke ehihie a.
Ụlọikpe mkpesa enweela onyeisi ọhụrụ

Ebe foto si, Justicemensem.com
Ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Tanko Mohammed eduola Monica Dogban-Mesem n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọikpe mkpesa bụ 'Appeal Court' na Bekee.
Dogban-Mesem bụbụ onyeisi ụlọikpe mkpesa dị n'Enugwu tupu onyeisiala Buhari ahọrọ ya n'ọkwa ọhụrụ a.
E duru ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị Fraide n'ogige ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja.
Ndị nọ n'emume idu n'iyi ọrụ a gụnyere ndị ọkaikpe nke ụlọikpe kachasị, ndị ọkaikpe ụlọikpe mkpesa ndị ọzọ, nakwa gọvanọ Plateau na Kebbi Steeti bụ Simon Lalong na Atiku Bagudu.
Dogban-Mesem bụ onye Plateau steeti.
Ọ ga-anọchi anya Zainab Bulkachuwa bụ onye lara ezumike nka dịka ọ gbachara afọ iri asaa.
Ikpe Maurice Iwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọkaikpe Nichola oweibo a kụchapụla arịrịọ Maurice Iwu rịọrọ ya ka e bufee ikpe gbasara ebubo nrụrụaka e boro ya si Legọs gaa Abuja.
Gọọmentị etiti boro Maurice Iwu, onye bubu onyeisioche INEC, ebubo izupu ihe karịrị otu ijeri naịra na ụma.
Iwu rịọrọ ka e bufee ikpe ahụ n'Abụja n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka o bi.
Mana ọkaikpe Oweibo jụwapụrụ isi, kwuo na ọtụtụ ndị ga-agba akaebe na ya bụ ikpe bi na Legọs.

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:



































