Fada Mbaka esorola ndị ụkọchukwu ibe ya mee "jogging" ikpeazu iji kwanyere Fada Paul Offu ugwu ikpeazu

Fada Mbaka na ọtụtụ ụkọchukwu ndi ọzọ bịara akwamozu Fada Offu n'ala.


Ndị ọzọ bịara bụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi na osote ya bụ Ceicilia Ezeilo nọ n'olili ozu Fada Paul Offu na Holy Ghost Cathedral n'Enugwu.


Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1


Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2

Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 3

Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 4
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 5
Cheta na na Mọnde ka ndị obodo Okpatu nke dị n'okpuru ọchịchị Udi, Enugwu Steeti nọ na nnukwu iru uju tata n'Ụka ozu akaara nwa ha nwoke bụ fada Paul tata na Holy Family parish Okpatu.

N'okwu Chukwu ya n'ụka ozu ahụ Fada Stan Eche kọwara na Paul Offu dịka akịdị ama oke ala ma bụrụkwa onye dị ike n'ekpere.
Fada Eche kwuru na ya na Paul Offu kpara nkata ụbọchị agbagburu ya nke doro ya anya na ọ dị ezigbo nkwadobe maka ndụ ebebe.
Ọ sị dịka Paul bụ onye ụkọchukwu hụrụ Virgin Mary n'anya nke ukwuu, odoro ya anya na nne dị asọ akpọrọla ya rigoro n'eluigwe.
Agbaara ya egbe ikpeazu nakwa nkwanyere ugwu ndị ọzọ dị iche iche.
Ndị Okpatụ BBC gbara ajụjụ ọnụ ji anya mmiri bụọ ndị gburu nwanne ha nwoke ọnụ.
Ozu Fada Paul Offu ga-esizi na Holy family Okpatu gaba na parish ọ nọ na-ya tupu ọnwụọ bụ St. James the greater Parish Ugbawka ebe a ga-akakwara ya ụka ozu nke abụọ na mgbede tata tupu elie ya echi na Holy Ghost Cathedral Parish dị n'Enugwu.
Cheta na ụbọchị abụọ gara aga, ndị uweojii n'Enugwu gbara mmadụ abụọ ha sị soro wee gbagbuo fada Paul Offu n'anwụ.



















