Fr Mbaka: Onweghi mgbe m ji buo amụma ọbụla banyere October 1

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria
Ụkọchukwu ụka Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka agọrọla aka na ụkwụ ya maka amụma a sị na o buru gbasara Ọktoba 1.
Ọtụtụ akụkọ kwuru na Mbaka buru amụma ọjọọ na-ekwu na oke mmiri ozuzo, egbeigwe nakwa ọchịchịrị ga-adakwasị obodo Naịjịrịa.
Akụkọ ndị ahụ kwukwara na Mbaka buru amụma na oke iwe Chineke ga-adakwasị onyeisiala Muhammadu Buhari, ma kwuo na ya ga-eyipu uwe ụkọchukwu ya ma ọ bụrụ na amụma ndị ahụ emezughi tupu abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba.
Mana n'ozi Mbaka zipuru n'akara Facebook ya bụ "Adoration Ministry Enugu Nigeria -AMEN", o kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ okpotokpo asị.
Mbaka kwuru na ụlọekpere ya anaghị enwe ekpere n'ụbọchị Tọọzde dịka akụkọ ndị ahụ siri kwuo.
O kwukwara o nweghị mgbe ọbụla o ji buo amụma ọbụla gbasara onyeisiala Buharị maọbụ October 1, maọbụ kwanụ iyipu uwe ụkọchụkwụ ya.
Ọ jụrụ sị: "Gịnị mere ndị mmadụ ji ebutere onwe ha abụmọnụ nakwa ọbọ Chineke?"

Ebe foto si, MBuhari Twitter
Ụkọchukwu Mbaka bụ onye a ma ama na-akwado onyeisiala Buhari.
Mana o kwuola n'oge gara aga, na ọ gaghị egbu oge ọbụla ịtụ onyeisiala mmehie ya n'ihu ma o mejọọ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










