Fr Mbaka: Onweghi mgbe m ji buo amụma ọbụla banyere October 1

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ụkọchukwu ụka Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka agọrọla aka na ụkwụ ya maka amụma a sị na o buru gbasara Ọktoba 1.

Ọtụtụ akụkọ kwuru na Mbaka buru amụma ọjọọ na-ekwu na oke mmiri ozuzo, egbeigwe nakwa ọchịchịrị ga-adakwasị obodo Naịjịrịa.

Akụkọ ndị ahụ kwukwara na Mbaka buru amụma na oke iwe Chineke ga-adakwasị onyeisiala Muhammadu Buhari, ma kwuo na ya ga-eyipu uwe ụkọchukwu ya ma ọ bụrụ na amụma ndị ahụ emezughi tupu abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba.

Mana n'ozi Mbaka zipuru n'akara Facebook ya bụ "Adoration Ministry Enugu Nigeria -AMEN", o kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ okpotokpo asị.

Mbaka kwuru na ụlọekpere ya anaghị enwe ekpere n'ụbọchị Tọọzde dịka akụkọ ndị ahụ siri kwuo.

O kwukwara o nweghị mgbe ọbụla o ji buo amụma ọbụla gbasara onyeisiala Buharị maọbụ October 1, maọbụ kwanụ iyipu uwe ụkọchụkwụ ya.

Ọ jụrụ sị: "Gịnị mere ndị mmadụ ji ebutere onwe ha abụmọnụ nakwa ọbọ Chineke?"

Buhari na Mbaka

Ebe foto si, MBuhari Twitter

Nkọwa foto, Fr. Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016

Ụkọchukwu Mbaka bụ onye a ma ama na-akwado onyeisiala Buhari.

Mana o kwuola n'oge gara aga, na ọ gaghị egbu oge ọbụla ịtụ onyeisiala mmehie ya n'ihu ma o mejọọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka