BBNaija: 'Aka anyị adịghi na ihe nkiri Kaffy na-eme' - Uweojii Ingland

Khafi

Ebe foto si, Instagram/acupofkhafi

Ndị uweojii nke Ingland bụ 'Metropolitan Police' (Met) ekwuola na ha na-enyocha onye otu ha bụ Kaffy Kareem Ahmed nke na-eme ihe nkịrị 'Big Brother Nigeria'.

Rebecca Byng bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi ndị uweojii 'Met' gwara BBC na ha ma na nwaada ahụ soro na ihe onyonyo ahụ, kama ha na-enyocha ya n'ụzọ nke ha.

O kwuru sị, "Otu onye uweojii nke ngabala 'Transformation Command' dere akwụkwọ ka e nye ya ikike i so n'ihe nkịrị nke onyonyo, kama enyeghị ya ikike".

Byng gara n'ihu kwuo sị, "Anyị ma na onye uweojii a so na ihe nkiri a ma ọ na-eme n'ike nke ya."

O kwukwara sị na Met akwadoghị onye uweojii ha iso na ihe nkiri a ma kwukwa na o nweghị otu o siri metuta 'Met'.

Byng gwara BBC na ha na-atụanya na onye uweojii nke Met ọbụla ga na-akpa ezi agwa ma ọ nọ n'ọrụ ma ọ nọghị n'orụ.

Khafi

Ebe foto si, Instagram/acupofkhafi

"Ndị na-akpa agwa na ezighi ezi nke megidere ụkpụrụ ndị uweojii 'Met' ga-anata ntaramaahụhụ kwesiri ekwesi."

Ọ gwakwara BBC na Kaffy Kareem Ahmed anarala ezumike akwụghị ugwọ tụpụ ọ rịọ ka o soro n'ihe nkiri onyonyo.

Ka ọ dị ugbua, Kaffy nọ ezumike.

Ndị na-elekọta Kaffy Kareem dịka onye na-eme ihe onyonyo edeputala akwụkwọ ebe ha na-akwado ya.

"Khafi bụ nwaanyị onyeisi ojii ụ onye nweojii nke ji ọrụ ya meme ọnụ ma were ndụ agbọghọbịa ya na nka ya nke gụnyere ịma asụsụ mba ise were ya arụ ọrụ."

Lee Akụkọ ga-Amasị gị

Lee ihe Nkịrị a

Aha onyonyo, 'M bụrụ anwụ anwụ, m ga-agakwuru Boko Haram nwee mkparịtaụka udo' - Klint da drunk