Sexual Abuse: Etu aka si kpara dọkịta a sị na-edina odibo ya dị 15 ka ọ chọrọ ime ya 'virginity test'

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Delta steeti anwụchiela otu dọkịta a na-enyo enyo naa o metọrọ nwata nwaanyị dị afọ iri na ise na-agbara ya odibo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Dafe Bright sị na ha nwụchiri Dkta Christian Osakwe sị nnyocha banyere ya ka na-aga n'ihu.
Ọ sị na ihe akaebe gosiri na o metọrọ nwata ahụ dị n'aka ha ugbua na ha chọrọ ịkpụpụ ya n'ụlọikpe ngwa ngwa.
Kedụ ka o si mee?
Otu onye na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Harrison Gwamnishu sị na mmadụ wetere mkpesa maka dọkịta ahụ n'ụlọọrụ ya bụ 'Behind Bars Human Right Foundation'.
Gwamnishu sị na dọkịta ahụ gwara nwata a na ọ chọrọ inyocha ya ahụ ọ kpọrọ 'virginity test' mana si zie ebe ahụ na-emetọ ya.
Ọ gwara BBC na mgbe ọ jụrụ nwata ahụ banyere ya, nwata ahụ sị na ọ bụ eziokwu na nna ya ukwu metọrọ ya.
Ọ sị nwata ahụ arụọla ọrụ n'ụlọ dọkịta ahụ ihe ruru ọnwa isii, ma sị na nne na nna ya bi n'Enugwu Steeti.
Ihe dọkịta kwuru
Onye dọkịta ọzọ nyochara nwata ahụ ma chọpụta na mmadụ kpara aka n'ihe o jiri bụrụ nwaanyị ma tipịa ihe a kpọrọ 'hymen' ya.
"A jụrụ m nwanne nwunye dọkịta dị afọ iri na asatọ banyere ya, ọ sị na ọ bụ eziokwu".
N'izuụka gara aga Gwamnishu wepụtara ihe onyonyo na soshal midia ebe ọ na-agba nwata ahụ ajụjụ ọnụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na dọkịta ahụ nyere ya otu nde naịra ma rịọ ya ka ọ ghara ịgwa ndị uweojii banyere ya.









