Sexual abuse of minors: Ụfọdụ mmetọ ụmụaka e merela na nsonso a

Ebe foto si, Getty Images
Iwakpọ maọbụ metọọ ụmụaka bụ arụ na-arị elu ugbua.
Kwa ụbọchị, ana-anụ akụkọ banyere etu ụfọdụ okenye ọkachasị ndị ezinaụlọ, agbataobi na ndị ọrụ ha bụ ichekwa ụmụaka ndị asi na-akpa agwụ achaghị acha.
Akụkọ mmetọ ụmụaka mere nsonso a
* Otu nwoke a kpọrọ Adamu Abdullahi dị afọ 65 bụ onye ndị ọrụ nchekwa 'Civil Defence' na Jigawa maka ịmetọ nwa dị afọ 11 matụwa ya ime.
* N'ọnwa Febụwarị 25, akwụkwọ akụkọ Punch kwupụtara na otu nwaanyị kpụrụ di ya bụ Gabriel ụlọikpe.
Akụko kwuru na o mere nke maka na e chere na di ya metọrọ ụmụ ha dị afọ iri abụọ na ise, afọ iri abụo nakwa afọ iri na atọ na Badagry, Legọs.
Ụzọ ị ga-esi chekwa nwa gị
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Dorothy Oleka bụ onye ọkaiwu nakwa ọkachamara n'ihe gbasara ikike dịrị ụmụaka kọwara ụzọ ndị mụrụ nwa ga- esi chekwa ụmụaka n'aka ndị osochiegbu a.
Lee ụzọ ụfọdụ ọ tụpụtara ndị nne na nna na gọọmentị ga-esi gbochie arụ a:
1. Ikwela ka di gị, ụmụ gị nwoke maọbụ odibo gị nwoke saa nwa gị nwaanyị ahụ.
2. Ahapụrụla ọbịa nwoke nọ n'ụlọ gị nwa gị nwaanyị ka o leta ya

Ebe foto si, Getty Images
3. Kuziere nwa gị ihe a na-akpọ akụkụ ahụ dị iche ya ma gwa ya ka otie mkpu mgbe onye ọbụla metụrụ ya aka n'otele

Ebe foto si, Getty Images
4. Jiri nwayọọ jụọ nwa gị onye nyere ya ihe onyinye ọbụla ị hụrụ n'aka ya abụghị nke i nyere ya.
5. Ọ bụghị sọọsọ nwa nwaanyị ka ana-emetọ, saa anya mmiri ma nwa gị nwoke ga ịnọnyere nwanne nna nwoke maọbụ nwanne gị nwoke.

Ebe foto si, Getty Images
6. Gọọmenti kwesiri ịdegharị iwu gbasara mmetọ ụmụaka nke kwuru na a ga enwe onye akaebe kama ka e jiri okwu nwata ihe mere dịka okwu akaebe.










