Vice President Debate 2019: Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa

Ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images/Getso/Gabam/Abdullahi-Iya//Rufai

Otu na-achụso ọchịchị ziri ezi, BBC na mba Naịjirịa nakwa TVC gbakọrọ aka hiwe nrụrịtaụka ndị osote onyeisiala na Naịjirịa ụbọchị Fraide.

Lee ihe ndị mere na ya bụ emume:

Ndị mere nrụrịtaụka gụnyere;

* Rabiu Ahmed Rufai nke AAC

* Khadijah Abdulah-Iya nke ANN

* Kunle Olateru Olagbegi nke ADC

* Yemi Osinbajo nke APC- Ọ bịaghị

* Peter Obi nke PDP- Ọ bịaghị

* Umma Getso nke YPP- Ọ bịaghị

* Shehu Gabam nke SDP-Ọ bịaghị

Aliyu Tanko na ngozi Alaegbu

Ndị chịkọtara ya bụ okwu bụ Aliyu Tanko nke BBC na Ngozi Alaegbu nke TVC.

Okwu ndị bụ isiokwu na ndọrịtaụka a bụ:

* Agụmakwụkwọ

* Akụnaụba

* Ahụike

* Nchekwa wdg.

Gwa anyị maka pati gị na ihe ejiri mara pati gị

Kunle Olateru Olagbegi nke ADC- Anyị ga-enye ụmụnwaanyị, ndị ọlụsị oke pasent 50 n'ọchịchị anyị.

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Ekwela ka onye ọ bụla gwa gị na Naijiria agaghị agbanwe- Naijiria ọhụrụ.

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN

Ebe foto si, Khadijah Abdulah-Iya

Okwu nchekwa

Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-eji teknuzu were na-ebuso nsogbu nchekwa agha.

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Ndị mmadụ anaghị arụzi ụra n'abali. Anyị kwesiri ijkọta aka anyị na mba ndị dịka Amerịka.

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- O kwesịrị na anyị na mba anyị na ha gbara agbataobi jikọrọ ọnụ na ọrụ ichekwa mmiri na ala dị na agbata any Naijiria na mba ndị ọzọ.

Nsogbu nchekwa na Zamfara

Rabiu Rufai

Ebe foto si, Rabiu Rufai

Rabiu Rufai- Steeti ahụ bụ steeti ndị otu APC, minịsta nchekwa sikwa na steeti ahụ. Ihe na-eme ahụ gosiri na ha adaala n'ọrụ ha.

Ị ga-agba ọtụtụ kilometa na steeti ahụ ịgaghị ahụ otu onye uweojii. Ọ bụghị ihe dị mma n'ihi na ndị omekakome ji maka ọlaedo dị n'ime ala na steeti ahụ na-enuba na ya.

Khadijah Abdulah- Iya nke ANN - Anyị agbahapụla etu anyị si echekwa onwe anyị n'ime obodo. Onye bịa obodo ọhụrụụ ọ ga-hụ eze obodo.

Anyị ga-alaghachị n'omenala ahụ. Anyị na ụlọọrụ ndị mba ọzọ ga-ejikọta ọnụ n'ikwalite ọrụ nchekwa dịka o si gbasa ike ndị omekataraihepụụjọ na-akpa.

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị ga-eji obodo ichekwa onwe ha, mkparịtaụka na aka ike were busoo nsogbu nchekwa agha.

Ụgwọ ọnwa opekatampe

Kunle Olateru Olagbegi nke ADC

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị ga-ebulite ụgwọọna opekatampe rue N100,000.

Rabiu Rufai nke AAC -Anyị bụ ndị bụ ụzọ kwube okwu ka eme ụgwọọna opekatampe N100,000.

Ọ bụrụ na-iche ego nri kwa ụbọchị onye ji ụmụaka anọ -na-eri N1000 kwa ụbọchị n'abali iri atọ, ha ga-etinye N30,000 naanị n'iri nrị.

Gọọmenti ochie wepụtara Napep,Sure-P. Goomenti ugbua wepụtara Tradermoni. Kedu atụmatụ ụmụ ga-ewepụta?

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị kwesịrị ịbụ isiobodo ebe ana-ewepụta gaasị.

Ọ bụghị na ịtaghị ndị na-ezu ego obodo ahụhụ ,ha aghaghị akwụsị ya. Anyị ga-apịchị ebe niile e si ezupu ego, were ego ndị a tinye n'ọrụ.

Rabiu Rufai nke AAC- Ihe anyị na-ahụ ugbua bụ iji ego na-azụ vootu na-akpọ ya 'Tradermoni. Ọ bụrụ na ha chọrọ ime ya ha kara ime ya gwa gwa ha banyere n'ọchịchị.

Ibi ego

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Ọ bụ amaghị eme mere na a na-eje ebiri ego nke ga-etinye ndị amụbeghị amụ n'ụgwọ n'ala anyị.

E kwesiri ịna-akpụpụ ndị na-ebi ego aghara aghara ụlọikpe.

Agụmakwụkwọ

Khadijah Abdulah-Iya, Kunle Olateru Olagbegi, Rabiu Rufai

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP- Anyị kwesịrị ịhaziharị kụrịkọlụm.

Anyị ga-ebidokwa ịkwado nchọpụta iji wulite mmepụta ngwahịa.

Ndị chịbụrụ etinyeghị uchu n' agụmakwụkwọ ya mere agụmakwụkwọ jiri kpụọ afọ n'ala.

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN-Anyị ga-akwalite agụmakwụkwọ n' ụlọakwụkwọ Praimarị nke ọha.

Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-etinye pasent 10 Bọjeti n'agụmakwụkwọ.

Ahụike

Rabiu Rufai

Khadijah Abdulah-Iya nke ANN- Anyị ga-etinye pasent 10 Bọjeti n'ahụike.

Anyị ga-ahụ na onye ọbula nọ n'atụmatụ ahụike 'health insurance.'

Kunle Olateru Olagbegi nke ADP-N

Rabiu Rufai nke AAC- Anyị ga-etinye ego n'ahụike. 160,000 Praimarị health workers na ọkpụrụ ọchịchị 774 dị na Naijiria.

Anyị ga-akwalite ọnọdụ ọrụ ndị ọrụ ahụike(dọkịta na ndị ọkamara n'ọgwụ)ka ha ghara ị na-agbapụ ala bekee.

Akụkọ ga-amasị gị: