Nigeria Election 2019: Ihe mere nrụrịtụka BBC n'ọwụwa anyanwụ ji bụrụ ọpụrụiche

Nrụrịtaụka n'Owere

Nrụrịtaụka nke BBC Igbo hibere maka ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ na ntuliaka 2019 abịala na njedebe mana akụkọ sọ ya n'azụ bụ ihe aka kpụ n'ọnụ.

Ka anyị tinye anya n'ọnụ na njem a, iji rụpụta ihe ụfọdụ ndị a.

Anyị ga-ebido n'Imo, bụ ebe amalitere ije a.

N'ọnwa Janụwarị, BBC Igbo dere n'akara Facebook ha na o chọrọ ka ndị mmadu họpụta ndị ha ga-achọ ka BBC kpọta na nrụrịtaụka ọ ga-eme n'Imo.

Tupu e mechie atụmatụ a, ndị mmadụ dere aha Uche Nwosu, Hope Uzodimma, Emeka Ihedioha na Ifeanyi Ararume.

Uche Nwosu

BBC gbara mbọ nweta ndị a ma zigara ha ozi maka emume a.

Ha niile kwere nkwa na ha ga-abịa nrụrịtaụka a ma, mana mgbe egwu ruru ọgbụgba, ọ bụ sọsọ Uche Nwosu bịara zaa aha nna ya.

Nke ka njọ bụ onweghi onye n'ime ndị a gwara BBC na ha agaghị abịa. Ma ruo mgbe nrụrịtaụka na-aga n'ihu, ụfọdụ n'ime ha na-aza ekwentị asị na ha nọ n'ụzọ abịa.

Ndị mmadụ kwuru ihe ha che maka ụdịrị agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchi kpara n'Imo.

Aha onyonyo, ihe ndi mmadu kwuru maka nrụrịta ụka BBC

BBC si Imo gawa Abịa ebe Alex Otti, Joseph Nkoro, Okezie Ikpeazu, Blessing Nwagba na Emeka Uwakolam bụ ndị kwenyere na ha ga-abịa ya bụ nrụrịtaụka.

Mgbe oruru n'omume, Okezie Ikpeazu sepụrụ isi na ya bụ nrụrịtaụka, ọ sị na ya nwere ihe ya na Onyeisisala Muhammadu Buhari mgbe nrụrịtaụka ga na aga n'ihu.

Ndị na-azọ ọkwa

Nrụrịtaụka gara ọfụma ma bụrụkwa ezigbote ohere iji hụ etu ndọrịtaụka emere n'Igbo ji bụrụ ihe ekwesiri ị na-eme mgbe ọbụla.

O gosikwara na asụsụ Igbo di ezigbote mkpa ikwalite.

Lee etu ya bụ nrụrịtaụka si ga ebe a:

BBC Igbo si Abia gawa Ebonyi, ebe Ogbonnaya Okorie na David Umahi bụ ndị pụtara ịdọrịtaụka.

Onye nke APC na steeti ahụ bụ Sonni Ogbuoji gwara ndị BBC na ihe mere ya ejighi bịa nrụrịtaụka ahụ bụ makana ọ na atụ egwu na ajọ ihe nwereike ime ya ma ya bịa.

Aha onyonyo, Maka nrụrịtaụka BBC n'Ebonyi

Nrụrịtaụka nke BBC nke afọ a gara ọfụma ma bụrụkwa ihe ga-eme mgbe ntuliaka ọzọ ga-eme n'ala Igbo.

Matakwa na oso n'ime nrụrịtaụka BBC mere na Naịjirịa maka ntuliaka nke 2019 - BBC Hausa, BBC Yoruba na BBC Pidgin mekwara nke ha.

Ihe mere nke BBC Igbo ji dị oke mkpa bụ na o bu nke bụ mbu ụdịrị ihe a na-eme n'Igbo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị