Hate speech: Ihe ndị ọ ga-abụ i kwuo ọ bụrụ okwu ịkpọ asị

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mgbe ka gọọmentị na-adọ ndị mmadụ aka na ntị maka okwu ịkpọ asị nke bụ 'Hate speech' na bekee.
Nke mere ugbua bụ na mịnịsta mbasaozi bụ Lai Mohammed sị na iwu a ga-eri ndị kwuru okwu ịkpọ asị ga-abụzi nde naịra ise (N5m) site na puku narị naịra ise (N500,000) ọ nọ bu na mbụ.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ aghọtaghị ụdị okwu ọ bụ ha kwuo ya bụrụ okwu ịkpọ asị, nke ha ji ama ọghọm dị na ya.
Gịnị bụ okwu ịkpọ asị 'Hate speech'?

Ebe foto si, SIA KAMBOU
Akụkọ nkọwa okwu sị na okwu ịkpọ asị bụ okwu ọbụla gosiri ịkpọ asị, ekworo, na-ebute ọgbaghara megide mmadụ, otu n'ihi agbụrụ, okpukperechi, agwa na ihe ndị ọzọ.
Okwu ịkpọ asị bụ okwu gosiri ịkpa oke n'ụzọ dị iche iche gụnyere obodo mmadụ si, nwoke maọbụ nwaanyị, isi ojii maọbụ ndị ọcha.
Ihe ndị ọzọ bụ:
- Okwu ọbụla iji kparị maọbụ iwetu mmadụ n'anya ndị ọzọ
- Okwu ga-eme ka ndị mmadụ kpọọ ndị ọzọ asị, dika: "Chukwu ekwela ka onye Igbo chịa Naijiria."
- Okwu ga-akpalite iwe agbụrụ megide agbụrụ ọzọ
- Okwu ga-eme ka ndị mmadụ mee ọgbaghara
- "Buhari bụ onye Fulani ọchịehi, ụmụnne ya na-egbusịsị mmadụ ebe ọbụla."
- Okwu ga-eme ka ndị otu agbụrụ megide ndị ọzọ: "Ndị ụka alakụba bụ ọgbaghara niile na-eme ebe niile."
Ngalaba gọọmenti na-ahụ maka mgbasaozi n'ikuku a kpọrọ "National Broadcasting Commission" (NBC) gbara ama na ha ga-eri ụlọọrụ ntaakụkọ ọbụla wepụtara okwu ịkpọ asị nha maọbụ napụ ha ikike ọrụ mgbasaozi n'ikuku.

Ebe foto si, Getty Images
Na nsonso a, NBC tara ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ ahụhụ maka okwu asị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a na-eme dịka ha richara ụfọdụ nha maka ịkpọ egwu ụfọdụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Armstrong Idachaba, ji ọkwa "Director Broadcast Monitoring" na NBC, kọwara BBC Igbo na okwu asị bụ ịkparị mmadụ n'ihi agbụrụ ya, ofufe chi ya, ọbụbụ nwoke maọbụ nwaanyị.

Ebe foto si, SODIQ ADELAKUN
N'otu aka ahụ, ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na Naijiria enweghị iwu ehibere maka "Hate Speech".
Kama na a na-eji iwu ndị ọzọ dịka iwu megidere ịkatọ mmadụ "defamation", "Libel" nakwa iwu "Social Media" were na-ejide ndị kwuru okwu na-apụ ụka.
Na nkọwa ya, okwu ga-emebi ihe maọbụ mee ka ndị mmadụ kpọọ ndị na-achị achị asị bụ ihe Bekee kpọrọ "Incitement".

Ebe foto si, Empics
O nwere ịke ime ka ndị uweojii nwụchie onye kwuru ya ọ kachasị ma ọ bụ n'okwu ahụ kpalitere ọgbaghara mere ka egbuo mmadụ.
Agbanyeghi nke a, Naịjirịa nwere iwu akpọrọ "Cyber Crime Act" metutara ụdịri ihe, mana ọtụtụ mmadu amaghi maka ya.
Lee etu onye ntaakukọ Chris Kehinde Nwado jiri kọwa etu Cyber Crime Act a jiri metụta ya.












