Rape and Sexual Abuse: Aka akparala ụmụnne abụọ a na-enyo na-edina nwata dị afọ itoolu n'ike

Ụmụaka abụọ e dinaara n'ike

Ebe foto si, Getty Images

Aka ndị uweojii Enugwu Steeti akparala ụmụnwoke abụọ bụ ụmụnne a na-enyo enyo maka idina nwata dị afọ itoolu n'ike.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na ha ebugaala ndị ahụ na ngalaba CID dị n'Enugwu maka nyocha tara ọchịchị.

Akụkọ sị na ọtụ nne na nna mụrụ ha abụọ, na ha si n'obodo Akpawfu nke dị n'okpuruọchịchị Nkanu East.

Otu a kpọrọ Women Aid Collective WACOL nke onyisi ha bụ Joy Ezeilo etinyela ọnụ n'okwu a ma sị ka e kpee ndị a ikpe ma taa ha ahụhụ ruru ha.

O kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigaara ndị ntaakụkọ n'Enugwu.

N'ozi ahụ, Ezeilo sị ha natara ozi n'ụbọchị 28 Nọvemba, 2021 na ụmụnne abụọ a kpọrọ Chima na Michael Nnamani si n'obodo Akpawfu na-emetọ nwata dị afọ itoolu.

"Nwata ahụ sị na ndị a malitere idina ya n'ike mgbe ọ bịara biri n'ụlọ ha, na ọ na-abụkaarị kwa ụbọchị ọkachasị n'ụtụtụ."

Ezeilo sị na mgbe ụfọdụ na ọ baara na-agbapụta n'ahụ kama o nweghi ọgwụgwụ ọ na-enwete.

"Ọ sị na ọ gwara nwanne nna ya bụ Theresa Nnamani na o nweghi ihe o mere banyere ya n'ihi na ụmụnwoke ahụ bụ ụmụ ya.

"Ọ sị na o nwere mgbe nwaanyị ahụ zutere ụmụ ya ka ha na-edina ya n'ike mana o nweghi ihe o mere iji kwụsị ya."

Ezeilo sị na ọ bụ ndị ọzọ nwata ahụ gwara ihe ọ na-agabiga n'ụlọ ha kpọtara n'ụlọọrụ ha bụ WACOL.

"Ụlọọrụ anyị degaara ndị uweojii Enugwu akwụkwọ nke mere e jiri nwuchie ụmụnne abụọ a.

BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ WACOL mana ọ zabeghi tupu akụkọ a na-apụta.