Child Abuse: Nwaanyị kụrụ nwata ntu n'isi n'Enugu agaala mkpọrọ

Ebe foto si, Enugu State Police
Ụlọikpe nta dị n'Enugwu Steeti enyela iwu ka etinye Ifeoma Ezeugwu na di ya Jude Ezeugwu n'ụlọ mkpọrọ maka imegbu nwa na-enyere ha aka n'ụlọ.
Ifeoma na di ya gbara nwa odibo ha aha ya bụ Nneoma Nnadi ose, daa ya igwe ọkụ ma were ntu kpọọ ya n'isi.
N'ụbọchị Mọnde, abali isii nke ọnwa June ka a kpụpụrụ ha ụlọikpe ma bo ha ebubo na ha chọrọ igbu mmadụ.
Ụlọikpe nyere iwu ka e tinye ha abụọ n'ime ụlọ mkpọrọ ruo oge a ga-ekpebi ya bụ ikpe.

Cheta na gọọmentị Enugwu steeti kwere nkwa na ihe niile gbasara nwaada Nneoma Nnadi dịzị ha n'aka.
Ha kwuru na ihe ndị a gụnyere ụgwọ ụlọọgwụ ya nakwa ọdịmma ya ruo mgbe o toro.

Ebe foto si, Enugu Police
Kọmịshọna na-ahụ maka ihe gbasra ụmụnwaanyị na mwulite mmekọ ọha bụ Peace Nnaji gara leta nwa ahụ ebe ọ na-anata ọgwụwgụ n'ụlọọgwụ ESUT dị na Parklane.

Ebe foto si, Wacol
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe mere n'okwu nwaanyị e boro ebubo ịkpọ nwa odibo nwaanyị ya gbara afọ 10 ntu n'isi.
A na-ebo Oriakụ Ifeoma Ezeugwu bi n'Enugwu ebubo ịkpọnye ntu abụọ n'isi nwatakịrị ya na ya bi aha ya bụ Nneoma Nnadi.

Ebe foto si, Goverenor Ugwuanyi updates
Ndị agbataobi gbara ama na nne ya ukwu jikwa igwe e ji ede akwa dị ọkụ boo ya bụ nwa nnukwu apa n'ahụ ya niile ma kpọchibido ya ụzọ ka ndị mmadụ ghara ịhụ ọnya juru ya ahụ.
Mana akụkọ ihe nwaanyị ahụ na-eme pụtara ihe n'ụbọchị Tọzde dịka ndị no nso nụrụ olu akwa ahụ ma gbata, zọpụta ya ma mee ka ọha mara.

Ebe foto si, Wacol
Na nkọwa ya, nne nwata ahụ bụ Oriakụ Nnedinso Nnadi, onye Aku n'okpuruọchịchị Igbo-Etiti n'Enugwu steeti, gwara BBC Igbo na, "onye o (Nneoma) binyeere, kpọrọ ya ntu n'isi were igwe e ji ede akwa daacha ya n'ahụ niile. Were ose tinye ya n'ahụ nwanyị ya".
Nnedinso, onye bụ ajadu nwaanyị, gara n'ihu kwuo na ihe mere ya jiri kpọnye nwaanyị ahụ nwa ya bụ na ha bụ nwanne.
"Ọ bụ nwa nwanne di m bịara sị ka m kpọnye nwa ya dị ime nwa m ka ọ na-enyere ya aka."
Ka ọ dị ugbua, Nneoma nọ n'ụlọọgwụ gọọmenti Enugwu steeti bụ 'Parklane Hospital, ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.
Ọkammụta Joy Ezeilo, onyeisi 'Women Aid Collective (WACOL), nke bụ otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye nke gbatara Ezinaụlọ ahụ ọsọ enyemaka, kwuru na ihe nwaanyị ahụ mere nwata ahụ bụ mpụ megidere iwu Naijiria dịka o siri gbasa ikike ụmụaka nakwa ịgba mgbere mmadụ (Trafficking).

Ebe foto si, Joy Ezeilo
Ezeilo tụrụ arịrị maka ụmụnwaanyị ji ụmụaka eme ohu ma kpọọ oku ka e nye ndị dara iwu a ahụhụ kwesịrị ha.
Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe, o kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ enyela ntuziaka ka ha nyochaa ihe mere n'okwu ahụ.
Ndukwe kwuru sị: "anyị ga-eme ka ọha obodo mara ihe anyị chọpụtara."










