Oji River Killing: 'Anyị ka na-eche ikpe ziri ezi n'isi Nwoke a e gburu

Eugene Iloabani
Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharị iwe maka ogbugbu e gburu Eugene Iloabani, onye mụrụ nwoke anọ na nwaanyị anọ tupu ọ hapụ ụwa a.

Ndị obodo Amamkpunatọ dị n'Oji River nke Enugwu Steeti sị ha ka na-eche ikpe ziri ezi n'ogbugbu Eugene Iloabani.

Onyeisi ọgbakọ obodo a bụ Ofor Chika Eze gwara BBC Igbo sị na ha anụbeghi n'ọnụ ndị uweojii etu nyocha maka ogbugbu Iloabani si aga.

Ọ sị na e kwuburu na anwụchiri otu onye mana ha amaghị ma ọ bụ eziokwu dịka onweghi mgbe a kpọrọ ha bịa hụ onye ọ bụ.

Ọ gara n'ihu sị na ọ bụ ha ji aka ha eche nche ugbua n'obodo ha kama na ndị uweojii na-abịa mgbe ụfọdụ ma gbagharịa n'obodo.

Aha onyonyo, Oji River Killing: 'Ndị ọchịehi anapụla m okpu eze'

Eze sị na ndị obodo ha kpebiri na ha achọghịzi ndị ọchị ehi n'obodo ha maka na ehi ha na-ebe ihe akụrụ n'ugbo.

Mgbe a jụrụ ya ihe gọọmentị Enugwu merela maka ọnwụ Iloabani na ọnọdụ nchekwa, ọ sị na gọvaọ Ifeanyi Ugwuanyi kwere ezinaụlọ Iloabani nkwa.

"Gọvanọ Ugwuanyi sị na ọ ga-azụ ụmụaka ya n'ụlọakwụkwọ site n'inye ha ohere agụmaakwụkwọ n'efu."

Kama na anụbeghi ozi site n'aka gọvanọ kamgbe ahụ, na ha chọrọ ị ga jụọ ya maka nke a.

E liri ozu Eugene Iloabani onye a na-eche na ndị ọchị ehi gburu na Tọzde ụbọchị 9 nke ọnwa Julaị, 2020.

Mana ọnụ na-ekwuru uweojii Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe ekweghi na o nwere onye ndị uweojii nwuchiri, kama ọ sị na nyocha ka na-aga n'ihu.

Cheta na n'ụbọchị Tuzde ka ndị obodo Amamkpunatọ bu ozu Eugene Iloabani mee ngagharịiwe n'isiụlọrụ okpuruọchịchị Oji River, Enugwu steeti.

Ha hụrụ ozu Iloabani n'ubi ya ebe ndị ekperima kere ya eriri ma gbuo ya.

Dịka ndị uweojii siri kwuo, amabeghi onye maọbụ ndị gburu nwa amadị a, mana ndị obodo na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọchịehi Fulani gburu ya.

Nwunye ya bụ Evelyn Iloabani kọrọ ka di ya siri gawa ọrụ ugbo n'isi ụtụtụ Monde Juune 29, 2020 ma ghara ịlọta na mgbede, mgbe ha jiri chọwa ya.

Gee olu Toby Okechukwu maka ogbugbu a

Aha onyonyo, Oji River Killing: "Gọomentị rụọ ọrụ nchekwa dịịrị ha" - Toby Okechukwu

O bu anyammiri n'isi kọwaara BBC ka ndị ha che na ọ bụ ndị ọchịehi siri gbuo di ya n'ugbo ya.

Evelyn sị na "ha kere ya eriri tupu ha egbuo ya n'ugbo ya. Mgbe anyị chọgara ya n'ugbo ya na mgbede, anyị hụrụ ndị ochịehi ebe ahụ. Mana ha gbapụrụ ọsọ mgbe ha hụrụ anyi".

Evelyn Iloabani, nwunye nwoke e gburu n'Oji River

Ebe foto si, Lady C Gbugu

Nkọwa foto, Evelyn Iloabani na nwa ya nwoke

Nwunye Eugene Iloabani, nwoke nwụrụ n'aka ndị e chere na ha bụ ndị ọchịehi n'Oji riva etiwala akụoyibo nsugbe.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọ kọwara n'uju etu o si chọpụta maka ọnwụ di ya nakwa etu obi si dị ya n'ihe onyonyo a:

Eugene Iloabani
Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharị iwe maka ogbugbu e gburu Eugene Iloabani, onye mụrụ nwoke anọ na nwaanyị anọ tupu ọ hapụ ụwa a.

Lolo ndị obodo Amamkponato bụ Chinyere Gbugu bụ onye du ndị mere ya bụ ngagharịiwe kọwara ka ha si buru ozu Iloabani gaa ya mkpesa.

O kwuru na "ụmụokoroọbịa gara n'ugbo bụ ndị hụrụ ebe e gburu Iloabani, ma hụkwa ihe yiri mgbaaka ndị ọchịehi."

Lolo Gbugu sị na onyeisioche okpuruọchịchị Oji River bụ Frank Udemezie kwere ha nkwa na ya ga-eme ka Gọvanọ steeti ahụ mata maka ya bụ ọdachị dakwasara ha.

Ndị omeiwu Enugwu steeti gakwara mgbaru na be ya bụ nwoke ka nke a mechara.

Bee Eugene Iloabani

Ebe foto si, Lady C Gbubu

Nkọwa foto, Ndị omeiwu Enugwu steeti gara mgbaru na be Iloabani ụnyaahụ
Iloabani

Ebe foto si, Lady C Gbugu

Nkọwa foto, Ndị bịara mgbaru na be Iloabani

Lolo Chinyere Gbugu sị na ihe dịka izuụka abụọ gara aga ka ha nụrụ kepukepu na ndị ọchịehi ga-awakpo obodo ha, mana ha ejighị ya kpọrọ ihe.

Ndị uweojii Enugwu steeti e biputalarị akwụkwọ ozi na-akatọ ya bụ ajọ agwa, ma na-eti aka n'obi na ha ga-ejideriri ndị mere arụ.

A. Abdurruhman

Ebe foto si, Enugu Police

Nkọwa foto, Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu tiri aka n'obi na ya ga-achọtalata ndị mere ịhe a

Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ A. Abdurruhman na-arịọ ndị Oji River ka ha dere juu ma ghara ịme ihe ọbụla ga-emebi nchọpụta ha na-eme.

Onyeisi ndị Miyeti Allah n'Enugwu bụ Alhaji Haruna sị na ha anụbeghị maka ya bụ ihe mere n'Oji River.

Ndị nagaghịiwe

Ebe foto si, coal city connect

E mekwara ngagharịiwe maka ọnwụ Iloabani taa n'Ọkpara Square, Enugwu.

Ndị mere ya bụ ngagharịiwe gụpụtachara ebe ụdị ihe ahụ mere n'Enugwu steeti ma na-akpọkụ gọọmentị ka ha bịa rụọ ọrụ nchekwa ha maọbụ ha e nwere aka ha chekwaa onye ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị