Coronavirus domestic violence: Ịzọpụta onwe gị n'aka onye na-emegbu gị n'ime 'lockdown' a

Ebe foto si, AFP
- Onye dere ya, Azeezat Olaoluwa
- Ndị mere akụkọ a, Women's Affairs Reporter, West Africa
Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma mbaụwa bụ United Nations ekwuola na mmegbu ụmụnwaanyị oge mmechi obodo bụ ihe a kpọrọ "shadow pandemic" n'asụsụ Bekee.
Na mpaghara Afrịka, ndị ọchịchị, ndị uweojii na ndị na-ahụ maka ikike dịrị onye ekwuola na mmegbu ụfọdụ ụmụnwoke na-emegbu nwunye ha na enyi ha nwaanyị bịara na-arị elu dịka a banyere na mmechi obodo a.
Mana gịnị ka ị nwereike ime onwe gị n'ụdịrị ọnọdụ a? Anyị jụrụ ndị ọkachamara nakwa otu nwaanyị si na mmegbu zọrọ isi onwe ya, ebumnuche ha na ndụmọdụ ha.

"Ị nọrọ n'ime mmegbu, ị ga-ahụ na e nwere usoro ihe si aga, Esther (ọ bụghị ezigbo aha ya) gwara m, dịka ọ na-echeta afọ atọ ya na onye ọ lụburu na-eti ya mmọnwụ oge ọbụla - ma iti ya ihe nakwa ịkpọgbu ya n'iyi.
"Na ngwụcha izuụka ka ọ na-ejikarị aka njọ, makana mgbe ahụ onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ. Mgbe ahụ ka onye ọ bụ gị na ya ga-enwe ọtụtụ oge ọkachasị ma ọ bụrụ na ike ịnọ n'ụlọ agwụla ya. Nke bụ na ị ga-ahụ na ha chọrọ ịchọ okwu. Ha ga-akpara gị nkata - ihe dịka ikwu okwu ga-akpalite gị ka ị nwee ike saa ya ma tizie gị ihe mgbe ị sara.
"Ọ bụrụ na ụbọchị abụọ nwereike ime ka onye ike ịnọ n'ụlọ gwụrụ chọọ iti gị ihe, chezie uche ihe otu ọnwa na ụma a sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ apụtala ezi buterela ndị mmadụ. Nke ugbua abụghịzị naanị ike ọgwụgwụ ịnọ n'ụlọ, ọ bụ ma mgbakasị ahụ ma ụjọ."

Ọtụtụ afọ agafeela ugbua kemgbe Esther kwarala ibu ya hapụ di ya. Mana mgbe ahụ, ọ kadị mfe isi na mmegbu ahụ gbalaga karịa etu ọ ga-adụ ugbua, ọ ga-ewe oge na obisike.
"Ọ dị m ka m nọ na mkpọrọ ebe m agaghị esinwu pụọ makana ihe rara ahụ, ma akụnụba o, ma ọnọdụ echiche obi, ma n'ọnọdụ echiche ụbụrụ - ma gụnyekwa ụmụ m. Ọzọkwa, nne gị ga na-enwe aṅụrị na ị lụọla di, nke bụ na ị ga na-eche - ekwela ka aṅụrị ya kwụsị. Nọrọ."
Maka ụmụnwaanyị chọrọ ịhapụ di ha na enyi ha nwoke n'oge mmechi obodo a, ọ ga-ara ha ahụ karịa. Ha chọọ ịpụ, ndị uweojii nwereike ịgwa ha na ha dara iwu onye apụtala ezi, ọzọ bụkwa na o nwereike ịra ha ahụ ịhụ ụgbọala ga-ebu ha.
Ọtụtụ mba ewepụtala akara ekwentị mgbata ọsọ enyemaka, maka inye ndị na-agabiga mmegbu ndụmọdụ nakwa inyere ha aka. Ndị na-achọkwanụ ha maka enyemaka a dị ọtụtụ.
'Ndị a na-emegbu emegbu na-arị elu'
N'isi mbido oge a machiri ịpụta ezi na mba Saụt Afrịka, ndị uweojii natara mkpesa 2,320 gbasara mmegbu ụmụnwaanyị - nke ji pasentịụ 37 karịa ka ha na-enwetabu mbụ.
Na mba Zimbabwe, otu ụlọọrụ ekwentị mgbata ọsọ enyemaka ahụ kwuru na ọnụọgụgụ mkpesa ha nwetara ji okpukpu atọ karịa, ebe Dorothy Njemanze bụ onye bu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi, gwara BBC News na etu ọnụọgụgụ ndị a na-emegbu emegbu na Naịjirịa si arị na-eche ya uche: "Ụjọ na-atụ anyị na ọ dịrị etu a na-aga, ndị mmadụ nwereike ịnwụ tupu e mepee obodo ọzọ."
Ụfọdụ mba dị n'Afrịka ewepụtala ụzọ a hụrụ anya e ji enyere ụmụnwaanyị aka. Na Tunishia, ebe mkpesa maka mmegbu n'ime ụlọ jirila okpukpu ise karịa etu ọ dịbu, gọọmentị ewepụtala akara ekwentị gbatagbata ma wepụta ebe mgbaba asatọ maka ndị a na-emegbu nakwa ụmụ ha, na-ekwukwa sị chebiri ụlọ mgbaba ndị ọzọ.

N'ụfọdụ ebe ndị ọzọ, e mepere ọtụtụ ebe mgbaba ma nwekwaa ndị wepụtara onwe ha inyere ụmụnwaanyị aka igbafu.
Na Zimbabwe, ndị okenye 21 na ụmụaka asaa ji ụlọọrụ Roots One Stop Shelter mere ụlọ mgbaba. Beatrice Savadye bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ kwuru na ha na-agba mbọ ịkpọpụta ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọ ebe a na-emegbu ha. Ndị uweojii na-akpọnyekwa ha ụfọdụ.
'Ebe mgbaba ụmụnwaanyị'
Na Kenya, Dianah Kamande bụ onye ọrụ ya bụ inyere ndị mmadụ aka, kwuru na ndị nwere ụlọ mgbaba ka na-anabata ụmụnwaanyị, ma kwuo na ụlọọrụ ya anabatala ụmụnwaanyị 17 naanị na Naịrobi.
Na Naịjirịa, n'agbanyeghi na ọtụtụ ebe mgbaba ụmụnwaanyị mechiri n'ihi mmechi obodo e tinyere, ndị na-enye aka n'efu ka na-enyere ụmụnwaanyị aka ịgbapụta ma lakwuru ezinaụlọ ha, dịka Titilayo Vivour, bụ onye na-achịkọta ngalaba na-ahụ maka mmegide mmadụ na Legọs steeti bụ Domestic and Sexual Violence Response Team, si kwuo.

Mana maka ebe mgbaba nke Ghana bụ Ark Shelter, Nana Sunnu bụ onye na-achịkọta ya kwuru sị na ha enweghi ikike ịnabata ndị ọhụrụ n'ihi ụjọ mbufe ọrịa coronavirus nakwa enweghi ebe a ga-edopu ndị mmadụ iche.
Esther bụ onye si na mmegbu gbapụta ma soro ndị ọzọ gbapụta na-arụ ọrụ ugbua, kwuru sị ka ụmụnwaanyị na-akpọ akara ekwentị ndị e wepụtara ma ọ bụrụgodi na ha nọ na mba ndị ụlọ mgbaba ha mechiri emechi.
"Gbalịa kpọkuo ndị na-ebu ikike dịrị onye n'isi site na soshal midia, ndị nke ị nwere ịtụkwasị obi. Kpọo ha, ha nwereike inyere gị aka tụmadị n'ime mmechi a."

Nthabiseng Ramothwala bụ onye na-ahụ maka ọnọdụ ahụike ụbụrụ mmadụ na Saụt Afrịka kwuru sị na ọ dị mma ka ndị mmadụ na-enyere ndị agbataobi ha nwereike ịnọ na mmegbu. Ọ dụkwara ụmụnwaanyị ọdụ ịrịọ ndị gbara ha gburugburu enyemaka.
"Mara ndị uweojii nakwa akara ekwentị ndị ị nwereike ịkpọ," ka ọ gwara BBC.
"Mee ka ndị agbataobi gị marakwa, gwa ha ihe nhụwa ama ha ga na-elepụ anya iji mara mgbe ha ga-eji gbatara gị ọsọ enyemaka. Nye ha akara ekwentị ezinaụlọ gị ndị nwereike ịbịa zọpụta gị."
'Anyị na-agba mbọ ịzọ onwe anyị ndụ'
Maka ndị enweghi ụzọ ha ga-esi gbapụta, Esther nyere ha ndụmọdụ.
"Ị kwesịghị imechi ọnụ n'ihi na ị chọrọ ka onye ọzọ nọrọ mma, mana n'ọnọdụ a, ọ bụrụ na ha kwuo ihe fụrụ gị ụfụ, gbachị ha nkịtị. Ha kpasuo gị iwe gaa gụọ akwụkwọ maọbụ mee ihe ọzọ iji wepụ obi gị ebe ha nọ.
"Ọ bụrụ na ị ga-editenwu otu ọnwa na abụọ maọbụ atọ na-abịanụ... mee ihe ọbụla ị ga-emenwu ga-enyere gị aka idi ya. Amaghị m ma anyị a ga-akpọnwu atụmatụ ndị a ngwọta. Ha bụ naanị ihe nwa mgbe nta.
"Ugbua, naanị ịzọ ndụ ka anyị na-agba mbọ ya, ya bụ na ị ga-ekwu ihe ha chọrọ ịnụ, mee ihe ha chọrọ ka ị mee, ka ị wee dịrị onwe gị ndụ."









