Coronavirus Lockdown: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmechi obodo n'ihi coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Awa ole na ole agaala kemgbe Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputere ndọtị iwu onye nọrọ n'ụlọ maka mgbochi mfesa ọrịa Coronavirus na Legọs, Ogun steeti na Abuja.
Mana ndị mmadụ ka kpụ ya n'ọnụ n'ihi na okwu mmachibido a metụtara ma onye ukwu ma onye nta.
N'ụbọchị 31 nke Ọnwa Maachị 2020 ka Buhari kwuru ka e mechie steeti atọ a, mana ọ dọtikwuru ya izu abụọ ọzọ n'ihi na ọrịa a ka na-enye nsogbu na Naijiria.

Ebe foto si, @BashirAhmaad
Gịnị ka ndị mmadụ na-ekwu maka ya
1) AGỤỤ:
Agụụ so n'otu ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka ha na-atụgharị uche maka okwu onyeisiala Buhari.
Ebe ụfọdụ na-ekwu na ihe ha goro iji chekwaa onwe ha n'izu abụọ gara aga agbadaala/agwụla, ndị ọzọ na-ekwu na agụụ dị n'obodo ga-egbu ndị mmadụ tupu ọrịa a akpata ha aka.
Ọtụtụ kwuru etu ihe nri na enyemaka gọọmenti kwuburu na ha ga-eke ndị mmadụ, erughị ha aka nke ha ji ahụ ya anya, ebe ndị ọzọ kwuru na ihe gọọmenti kere enweghị ka ọ ha aha.

Ndị mmadụ ejirila makana Buhari kwuru na ọ ga-eke ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ego iji nyere ha aka n'oge a, tiwe mkpu na soshal midia si gbatara ha ọsọ enyemaka nke ha.
Ha kwuru na izu abụọ a gọọmenti tụkwasịrị ga-ata akpụ ka alanga, nke bụ na ha chọrọ enyemaka chọsie ya ike.
2) NCHEKWA:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Kemgbe izu a, ụfọdụ ndị bi na mpaghara Legọs gụnyere Ọgba, Egbeda, Agege na ebe ndị ọzọ chị obi n'aka ka ha na-emechi naanị otu anya alaba ụra.
Gịnị kpatara ya? Ndị omekome na-enye oke nsogbu kwa abalị, nke kawanyere njọ ugbua mmadụ niile nọ n'ụlọ.
Ndị mmadụ akpọkuola gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi mwakpo a ndị ohi na-awakpo ha.
Ha na-atụ ụjọ na ndọtị a a dọtikwuru oge ịnọ n'ụlọ ga-eme ka ndị ahụghị rie chụrụ ndị ha chere na ha nwere ma nwebiga ya oke, gawa.
Ọkachasị ụfọdụ ndị sị na ndị ohi ahụ na-edetara ha akwụkwọ ozi iyi ha egwu maka ọbịbịa ha.
3) ỌRỤ:

Ebe foto si, Instagram/Republic Journal
Ọtụtụ bụ ndị oji ego achụ ego ekwuola na ndọtị mmachibido anaghị enyere ha aka n'azụmahịa ha.
Ha kwuru na ọ na-abụ site n'ihe ha zụpụtara maọbụ rụpụta ka ha zi azụ onwe ha nakwa ndị ọzọ gụnyere ndị na-arụrụ ha ọrụ, nri.
Iwe ha bụ na ndọtị a ga-eme ka ha ghara ịkpata ego iji nyere onwe ha na ndị ahụ aka.
4) IKE ỌGWỤGWỤ:
Dịka gọọmenti na-ekwu na ọ dị mkpa ịnọ n'ụlọ maka ibelata mfesa ọrịa a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ike agwụla ha.
Ha na-ekwu na "ọkụ adịghị, nri adịghị, ego adịghị" na ha amaghị etu ha ga-esi nọrọkwa izu abụọ ọzọ n'ime ọnọdụ a.
Ebee ka gọọmenti kwụ akwụ?
Gọọmenti na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus a ga-akwụsị ịrị n'ime izu abụọ a, nke bụ na ọ ga-anọzị n'ụzọ ụla.
Ọ bụrụ na nke a mee, obodo ndị a nwereike laghachi na ndụ ha na etu ihe dịbu.









