Violence Against Women: Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinaụlọ na-emekpa gị

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ụzọ ole na ole ha si a nabata mmegbu dị n'ezinụlọ nakwa mwakpo n'udiri ọbụla.
Nke a mere ka otu United Nations wepụta ụbọchị Nọvemba iri abụọ na ise n'afọ ọbụla ịkusi okwu ike maka nkwụsị atụmaatụ ọjọ a.
Lee ihe ịse ị ga-emenwu iji gbanarị udiri nwakpo ọbụla
Titilola Vivour Adeniyi bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onyeisi ngalaba 'Lagos State Domestic Violence Response Team' na-ahụ maka iza oku ndị awakporo awakpo na Legọsị kwuputere ihe ndị a dịka:

1. Kwupute okwu
Vivour rịọrọ ka ụmụnwaanyị ghara ịtụ ụjọ ikwupute maka etu esi wakpo ha maọbụ awakpo ha.
O kwuru na nkwupute ga-enyere gị aka ka inweta enyemaka zuruoke ga-eme ka aka kpara onye na-awakpo gị.
2. Nwee ihe ngosi ị ga-eji chere onye ahụ n'ụlọikpe
Vivour kwuru na ihe ngosi a ga-apụta site n'iga mee ahụ gị nyocha n'aka dọkịta, ihe ọ bụla o dere maọbụ nyochapụtara bụ ihe ị ga-eji chere onye wakporo gị n'ụlọikpe.
3. Wepụ okwu ahụ n'ụlọikpe
O kwuru na enwela iwu megidere onye ọbụla wakporo nwaanyị na Legọs steeti.
O kwukwara na nwakpo bụ agwa megidere steeti ya mere ntaramahụhụ so ya bụ ịga mkpọrọ ebiebi.
4. Bido na nwa kuziwere ụmụ gị maka ihe ọjọọ dị na ịmegbu mmadụ
Ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ site n'obere kuziwere ụmụ ha bụ nwoke maka etu esi akwanyere ụmụnwaanyị ugwu.
Vivour kwukwara na ọ ga-adị mma ka ụmụnwoke bido na nwata hụtawa ụmụnwaanyị dịka mmadụ ibe ha.

Ebe foto si, AFP
5. Obodo kwesiri ị guzo kwado ụmụnwaanyị ka ha kwuputa maka mwakpo
Vivour chọrọ ka obodo kwado nwaanyị ọbụla beputere akwa na a na-awakpo ya ebe ọbụla.
Ha mata na o nwereike ịbụ onye nke ha echi.









