IPPIS Registeration: Ihe mere anyị achọghị iso n'atụmatụ IPPIS - ASUU

Ọ bụghịzi akụkọ na gọọmentị etiti na otu jikọtara ndị nkuzi mahaduma na Naịjirịa anaghị esi otu ụzọ aga n'okwu banyere ụfọdụ ihe.
Otu n'ime okwu ndị ahụ bụ nke a kpọrọ 'Integrated Payroll and Personnel Information' bụ usoro e ji edebanye aha maka ịkwụ ụgwọ ọnwụ.
Gọọmentị etiti chọrọ ka ndị nkuzi mahadum malite soro n'atụmatụ a n'ụbọchị 25 Nọvemba, 2019 mana ha kpọrọ ekwe nkụ sị ọ gaghị adị ha mma n'ahụ.
Onyeisi otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ ọkankuzi Biodun Ogunyemi gwara BBC Igbo sị o megidere ikike mnwereonwe ndị mahadum na Naịjirịa n'ụzọ ndị a;
- Atụmatụ IPPIS ga-eme ka onye nkuzi ọbụla gaa debanye aha n'Abuja tupu a kwụọ ya ụgwọ ọnwa, bụ nke megidere iwu eji hiwe madaduma na Naịjirịa.
- Igbochi ohere agụmakwụkwọ maọbụ nkuzi ihe site n'aka ndị ọkankuzi si na mba ofesi - Nke bụ na onye ọbụla si ofesi na-abịa ikuzi ihe ga-eche ka gọọmentị etiti nye ikike tupu ọ malite. O kwuru na oge nke a ga-efu ga-eme ka e gbochi ụdị ndị a ịbịa kuzie ihe.
- Nke ọzọ bụ na ego ọnwa ndị a ga-anọte aka tupu a kwụọ ya ebe a na-achọ inwete ikike n'aka gọọmentị etiti.
- Ọ ga-egbochi ohere mahadum ndị Naịjirịa nwere iji maa nke ndị mba ndị ọzọ aka n'ihu.
- Ọ sị na a bịa n'ibuagha megide mpụ na nrụrụaka, bụ ebe gọọmentị gbakwasịrị ụkwụ tinye atụmatụ a, na mahadum nwere usoro ha ji ebuagha megide mpụ dị n'ime ha.
- Mgbochi nwulite akụnaụche n'ime mahadum nke bụ na tupu ewere onye nkuzi ọbụla n'ọrụ, gọọmentị etiti ga-ama maka ya.
Ogunyemi sị na ha eburula okwu a gaa n'ụlọomeiwu bụ ndị kwere nkwa na ha ga-elebanya n'ime ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmentị chọrọ ihiwe ụdị atụmatụ a, ka ha nye mahadum dị iche iche ime nke n'ime ụlọ ha.
Na ọ bụ ụdị atụmatụ a ka ha gwara ndị ụlọomeiwu bụ nke ha sịrị ha gaa leba ya anya.
Ogunyemi dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha ghara itinye aka n'atụmatụ IPPIS ahụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









