Manchester United vs Sheffield United: Man Utd alaala na mgbuka?

Ole Gunnar Solskjaer

Ebe foto si, Press Association

Nkọwa foto, Ole Gunnar Solskjaer na-eche ihe ya n'ụwa ga-eje
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụwa gbara Ole Gunnar Solskjaer gharịị n'ọgbọegwuregwu Bramall Lane ka Sheffield sachara goolu nke atọ ha chọrọ iji merie ha bụ nke ha ji gbata ọkpụ atọ onye lawa.

Ọrụ a adịghịri Ole Gunnar Solskjaer mfe kemgbe Maachi afọ a o nwetachara ya bụ ọrụ.

Sheffield ji otu ọkpụ sị Manchester United ndewo na nkeji 19' amalitechara ya bụ asọmpi bụ nke John Fleck fekenyere n'ọnụ mpịọ ndị Man U bụ nke gooli kụnyere na mpio ha.

Sheffield jisiri ya bụ goolu ike ruo mgbe a gara ezumike.

Ka a batara ya bụ ezumike, Manchester United ritere akwụkwọ ịdọ aka na ntị site na ajọ agwa Brandon Williams na nkeji 50' ebe ha na-esị ọnwụ goolu.

Mana obi siri Sheffield United ike dịka ha nyere goolu nke abụọ na nkeji 51 site na'aka Lys Mousset.

Manchester United gwara ha na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa dịka ha tetere n'ụra na nkeji 72' mgbe Brandon Williams gbaara isi onwe ya na goolu mbụ ha.

Daniel James

Ebe foto si, ALLSPORT/Getty Images

Nkọwa foto, Daniel James nke Manchester United nyere onye otu ya bọọlụ

Goolu nke abụọ ha sochiri ha azụ na nkeji 77' mgbe Mason Greenwood zara aha ya bụ nke mere ya 2-2.

Na nkeji 79' Marcus Rashford tinyere goolu nke atọ ha na mpio ndị Sheffield bụ nke mere ya 2-3.

Ihe mere ndị Sheffield.

Mgbe ahụ ka a malitere ị gọ ọfọ ọbịara be onye abịagbule ya.

Chi ha zara ha ya bụ ekpere na nkeji 90' kpọmkwe tupu egbuchie ya bụ egwuregwu bụ mgbe ha sara ya bụ goolu ha jiri gbaa 3-3.

Ọ bụ n'ụkwụ Oliver McBurnie ka Sheffield sị saa ya bụ goolu.

Ọdachị ụgbụelụ Congo

Ụgbụelụ na Congo

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụgbụelụ a kpọgharịrị ụgbọrọ atọ n'elụ tupu ọ kụjaa n'ala

Ụmụibe ka ọ dị ugbua, agụtala mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị nwụrụ na ya bụ ụgbọelụ dakwasara ụlọ na Democratic Republic of Congo.

Otu ezinaụlọ mmadụ itoolu so na ya bụ ọnụọgụ.

Ya bụ obere ụgbọelu dakwasara ụlọ n'ogbe Mapendo ka ọ fuchere ụzọ ya mgbe ọ na-efeli na ọdọụgbọelụ dị na ugwu Kivu, dịka Gọvanọ Nzanzu Kasivita kwuru.

A na-akọwa na ọ bụ ndị ọrụ mmadụ iri na asaa nọ na ya bụ ụgbọelụ mgbe ọ kpọkasiri.

A ma Congo dị ka obodo ihe mberede ụgbọelụ na-emekarị.

Nke a mere ejighị ekwe ụgbọelụ ndị njem ha febata mba Europe Union.

Ọdachi ụgbọelu

Ebe foto si, @ELIEZAIREUSHIN

Nkọwa foto, Ndị mmadụ gbakọrọ ịma ma ha a ga-enyerenwu onye ọbụla na-anwụghị aka

Ihe a ma maka ihe mberede a mere?

Ụgbụọelụ a bụ Dornier-228 "twin turbprop" bụ nke ndị ụlọrụ Busy Bee kpọjara otu nkeji ofelichara, dịka otu onye nọ n'ọdọụgbọelụ Goma gwara BBC.

Ya bụ ụgbụelụ kwesiri ị ga Beni dị kilomita 350 n'ụgwụ Goma.

O dobeghị anya ihe butere ya bụ ọdachị mana ndị mmadụ na-ekwu na njin ya adịchaghị mma dịka ofeliri dịka onye ọrụ BBC bụ Emery Makumeno sị kọọwa na Kinshasa.

Ndị ọrụ gbata gbata na ndị agbataobi gara ebe ahụ ozigbo ịzọpụta ndị mmadụ nakwa ndị nwụru anwụ.

A matabeghị mmadụ ole nọ n'ụlọ be ha mgbe ya bụ ọdachị dara.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Gọvanọ Kasivita bụ onye kwuputara ya bụ ọdachị sị na "ya bụ ihe lara mkpụrụobi ndị obodo ha n'iyi", ma kasịkwa ha obi.

BBC a kpọọla Busy Bee maka ọnụokwu ha.

Umahi sị na ụbịam adịghị n'Ebonyi ka e si ekwu

Gọvanọ Dave Umahi

Ebe foto si, Dave Umahi

David Umahi agwala ndị sị na Ebonyi steeti gbara ndị nke asaa n'ụbịam na Naịjirịa ha gaa chiri akwa ha ebe ha sara ahụ.

Umahị sị na ihe ahụ bụ akaọrụ ndị obi akpọ chọrọ iduhie ndị mmadụ ụzọ.

Onye nọ na nga ezutele ọnwụ ya

Onye a tụrụ ịga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye a tụrụ ịga

Ọzọ kpọtụrụ taa bụ na otu onye mkpọro anwụọla n'ụlọmkpọrọ ndị na Eket dị na Akwa Ibom steeti.

Onyeisi ụlọmkpọrọ ahụ bụ Alex Oditah sị na ha na-etinye anya ịmata ka ya bụ mmiri sị baa opi ụgbọghịrị.

Kụpụrụnụ Chimamanda Adichie aka...

Nwaada a nwetara nturuugo na mba Amerịka n'aka otu a kpọrọ 'United Nations Foundation Global Leadership Award', maka etu o si eji ide na ịkọ akụkọ ejikọta ndị mmadụ na omenaala dị iche iche nakwa ịrụtụ aka n'ịkpa oke agbụrụ.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Nke a emeela ya onye pekarịchara n'afọ si mpaghara Afrịka na-erite nturuugo a.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

N'egwuregwu,

Manchester United nọ n'ogogo nke iri na tebulu Premier League ugbua, ga-ama ma ọnọdụ ha ọ ga-agbanwe, mgbe ha na Sheffield United ga-ezute.

Ebe e ji goolu gbajuo ndị egwu bọolụ Naịjirịa na-agba n'aja afọ, oge Pọtugal ji ọkpụ iri chara acha, saa otu goolu ha ji na-emeri ha, n'asọmpi Iko Mbaụwa na-aga ihu na Paragụaị ugbua.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Wilder akụpụla Ortiz ọkwụrụ n'anya

Deontay Wilder

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Wilder ga-ezute Tyson Fury n'ọnwa Febrụwarị 2020

Ị nụkwara na Deontay Wilder ji ọkpọ kụpụ Luis Ortiz mkpụrụ ọkwụrụ n'anya n'ọgbọọgụ n'agba nke asaa?

Mmeri Wilder pụtara na ọ ka ji belt WBC ya nke ugboro iri, n'agbanyeghi na Ortiz yiri ya egwu n'ime agba isii niile ha pịara ọkpọ.

Luis Ortiz

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ortiz bụbụ agada gbachiri ụzọ n'ọkara nke mbụ n'ọgụ ha, ruo mgbe Wilder hụrụ ohere wee kụtuo ya ala

Lee etu e si pịatuo Ortiz

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Teknụzụ ga-eme ka Naịjirịa bụrụ mba mepere emepe - Osinbajo

Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Yemi Osibanjo/Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari esila n'ọnụ osote ya bụ Yemi Osinbajo kwuo na e nweghi ihe mere Naịjirịa ga-eji ka dị ka obodo na-emepeghị emepe.

Ọ gara n'ihu kwuo, na ọ bụ teknụzụ ga-ebute mgbanwe na mmepe obodo ma ọ bụrụ na anyị jiri ya kpọrọ ihe.

Ndị gwuru onye ọcha chandum,

Ndị gwuru onye ọcha chandum

Ebe foto si, Imo state Police

Aka ndị uweojii nọ Imo steeti akparala mmadụ atọ gụnyere otu nwaanyị, a na-enyo maka igwu onye ọcha chandum.

Dịka Orlando Ikeokwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, mmadụ atọ ahụ anapụtara otu ụgbọala, ekwentị nakwa ihe ndị ọzọ, gwuputere ihe karịrị puku narị asatọ n'aka nwaanyị onye ọcha tupu a nwụchie ha.

N'ofesi,

Ndị pụtara ịtụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ pụtara ịtụ vootu n'ọgbọ ntuliaka

Ndị mba Họng Kọng na-eme ntuliaka maka onye ga-abanye n'oche narị anọ na iri ise na abụọ maka ọchịchị ime obodo.

Ha na-eche na ọ ga-abụ ụzọ ndị mba ahụ na-eme ngagharịiwe kemgbe ọnwa Juun, ga-esi gosi ebumnobi ha ebe mba Chaịna nakwa ndị na-achị ha, nọ.

Ndị pụtara ịtụ vootu nke afọ a karịrị ndị nke pụtara ịtụ ya n'afọ 2015.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Igbos in UK: Lekwa ka ndị Igbo bi na Liverpool si emepụta omenaala Igbo