Plane Crash: Ụgbọelu abụọ sukọrọ ọnụ egbuola ihe ruru mmadụ asaa na Spain

Ebe foto si, Incendios F Baleares
Ihe ruru mmadụ asaa anwụọla dịka otu helịkọpta na ụgbọelu ntakịrị ọzọ kụkọtara isi n'elu n'obodo Mallorca dị na mba Spen.
Akụkọ kwuru na mmadụ abụo na-erubeghi afọ iri na asatọ so na ndị ọ tara isi ha.
Mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede a, gụnyere ụmụntakịrị abụọ a, nọ n'ime helịkọpta ahụ, ebe abụọ ndị ọzọ nọ n'ime ụgbọelu fecha-fecha nke ọzọ nwere naanị oche abụọ.

Mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Ebere Amarizu
Akụkọ ruru anyị ntị na-akọwa na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Ikirike dị n'Idaw-river, n'Enugwu steeti n'isi ụtụtụ a wee merụọ ụfọdụ ndị uweojii ahụ mana enweghi onye nwụrụ.
Ndị omekome a bu mma na osisi, ji aghụghọ na ha bịara ime mkpesa bata n'ime ụlọorụ ndị uweojii ebe ha nọ kpaa mkpamkpa ha ma gbalaga.
Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ, kwuru na ha atụọla imi n'ala iji chọpụta ndị omekome ahụ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị omekome awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugu state
Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya ebe a:
Gọọmentị na-adọ ndị "sabo" aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-agba onye ọbụla ga-agba ngalaba ha hibere a kpọrọ Social Investment Programmes mgba okpuru, akwụkwọ.
Maryam Uwais bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye onyeisiala Naịjirịa, kwuru nke a ka ọ na-akọwa na gọọmentị ga na-eme ihe niile ịhụ na ngalaba ahụ rụrụ ọrụ e ji hibe ya, n'ụzọ kwụ ọtọ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Manchester City gosiri ihe ha ji bụrụ dike dịka ha ji goolu atọ a satara naanị otu zọgbuo Bournemouth ka agbụsị.
Nke mere ka ha nwee pọintị asaa ugbua ma nọrọ n'ogogo nke abụọ na tebulu Premier League.
Gọọmentị kwụsịnụ iji aka ike eso ndị ngagharịiwe - Soyinka

Ebe foto si, Getty Images
Ọkammụta n'ide akwụkwọ bụ Wole Soyinka adọọla gọọmentị aka na ntị banyere iji aka ike na-anwụchi ndị na-eme ngagharịiwe dịka ọ bụ ikike ruru ha.
O kwuru nke a na-emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya na Satọde 23 Ọgọst, 2019 dịka ọ gbarala afọ 85.
Soyinka sị na ihe ụtọ dị n'obibi ndụ bụ mmadụ inwe ohere ikwupụta uche ya n'oge ọbụla.
N'okwu ya " Ọ bụ ikike dịrị onye, anyị agaghị agbaha ya ma ọ dị mkpa ka e zigara gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa ozi a ka ha ghara ịkpachị ndị gbakọtara na ntụgharị uche."
O kwuru na ụlọọrụ gọọmentị kwesiri ịkwanyere ikike dịrị ndị ugwu ma ọ bụrụ na ha ekpebie iji ngagharịiwe gosi mwute banyere ọchịchị dị.
Cheta n'izuụka gara aga, ndị uweojii gara kpọchie ogige ebe Soyinka na ndị chọrọ inwe mkparịtaụka maka ọchịọchi.
Ihe idemmiri na-eme n'Enugwu

Ndị bị na obodo Eke Obinagu Emene dị n'Enugwu Steeti etiela mkpu n'oke olu maka ike idemmiri na-akpa n'obodo ha.
Ha kwuru na ọ bụ n'ihi enweghi ezi ntọala ọwa mmiri mere idemmiri ji anyụ ha ịkpakwụ.
Na mba ọzọ

Ebe foto si, Ikulu
Mba Saụt Afrịka akpachiela ụgbọelu mba Tanzania dịka gọọmentị mba Tanzania si kwuo.
Saụt Afrịka ekwubeghi okwu banyere nke a mana otu nwoke larala ezumike nka n'ọrụ ugbo sị na ọ bụ maka ego dị nde dọla iri atọ na atọ gọọmentị Tanzania ji ya n'ụgwọ butere mkpachi ahụ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ sị ka ha kpọgbuo Marcus Rashford na-agbara Manchester United bọọlụ n'iyi maka ịta penariti n'asọmpi ha na ndị Crystal Palace meriri ha.
Rashord na Paul Pogba bụ ndị Manchester United abụọ akpọrọla iyi na soshal midia n'ime otu izuụka.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji
Ihe nkiri a ga-amasịkwa gị:











