Texas Plane Crash: Ihe mberede ụgbọelụ ataala isi mmadụ iri
Akụkọ kachasị taa
Mberede ụgbọelụ na Taxas

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi e, ụgbọelụ akụjaala ma gbuo mmadụ iri nọ n'ime ya na Taxas dị n'Amerika.
Darci Neuzil bụ onyeisi ụlọrụ ọdọụgbọelu ebe ya bụ ihe mere na-ekwu na ewepụtabeghị aha ndị ya bụ onwụ mberedere dakwasara ka ọ dị ugbua.
Ya bụ ụgbọelụ kpọbara n'ụlọ ebe a na-edowe ụgbọelu n'ọdọ ụgbọelu ahụ.
Ala adịghị n'AlaIgbo maka Ruga

Dịka ọ na-akpọtụ maka ogige Ruga Gọmentị etiti na-achọ maka ndị Fulani na-achị ehi,
Onyeisi ndị gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi ekwụsiela ike n'ọwụwa anyanwụ ahụghị ụtụrụ rachaa n'ala ma ya fọkwa nke a na-enye mmadụ.
Mgbere ụgbọmmiri na Legọs

Ebe foto si, Getty Images
Na Legọs steeti, ihe dịka mmadụ atọ anwụọla n'ụgbommiri kpuru na steeti ahụ.
Onyeisi ndị Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) bụ Olufemi Oke-Osanyintolu kwuru na agụpụtara ozu mmadu atọ ma nani mmadu atọ ọzọ ga a gụpụtara na-ndụ.
Ụgbommiri siri Badore-Ajah a ga Ikorodu bu ihe dịka mmadu iri abụọ ekpuola .
Ụgbọ mmiri dara iwu dịka o bu ndị mmadu karia ihe okwesiri ibu ma onweghị kwa onye yi uwe nchekwa a na akpọ "life Jacket" na bekee.
N'egwuruegwu,
Gernot Rohr ekwụọla ihe mere ha jị dajie ukwu

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu e, Onyenkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na-onweghị ihe mgbagwojuanya dị na ndị Madagascar meriri ndị otu ya.
Rohr sị na Super Eagles agbaghị bọọlụ otu ha kwesiri ịgba maka na ha agafeelarị n'agba nke ọzọ.












