Sowore #RevolutionNow Protest: Ihe ndị ntoroọbịa na-ekwu maka ngagharịiwe a

Abalị 5 nke ọnwa Ọgọst 2018 ka atụmatụ ngagharịiwe "Revolution Now" onye zọbụrụ ọchịchị n'okpuru patị African Action Congress (AAC) bụ Omoyele Sowore hibere kwesiri ịmalite.
Ọ bụ na steeti dị iche iche ka ngagharịiwe a kwesiri ịmalite mana ọ bụ sọsọ na Legọs ka e mere ka a ga-amalite ya tupu ndi ọrụ nchekwa etisasịa ndị pụtara.
Agbanyeghị na ọtụtụ ndị ntorobịa na soshal midia kwuru na ha kwadoro ngagharịiwe a, nanị mmadụ olemole zọrọ ụkwụ n'ọgbọ egwuregwu a kpọrọ "National Stadium" ka chi bọrọ.
Nke a na-abịa ka ndị ngalaba nchekwa akpọrọ DSS nwụchịrị Maazị Sowere ụbọchị Satọde.
Ọzọ nwereike bụrụ maka na ndi uweojii sị na onye ọbụla pụtara ngagharịiwe a ga-ahu ihe ndị na-agba obodo mgba okpuru na-ahụ.
Mana ka o si kwụrụ, ndị uweojii na ndị agha ekweghi ka ndi pụtara atụmatụ a kuru mmiri tọgbọ iko.

Anwụchịrị ndị anwụchịri ma chụmie ndi ọzọ. E ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime 'Revolution Now' na Lagos.
Aka na-achị Rivers steeti bụ Nysom Nwike sọkwa wụọ mmiri oyi n'atụmatụ a mgbe o kwuru na ya achọghị ịnụ maka ya na steeti ya.
Mana, ọpụtara na ndị ntoroọbịa akwadoghi ngagharịiwe a?
Dr McGinger Ibeneme sị na ọtụtụ mmadụ gbajọrọ ngagharịiwe a n'ihi onye haziri ya.

"Sowore so n'ime ndị kpọbatara Buhari ma bụrụkwa onye ama na-eme ihe naanị ya."
O kwukwara na okwu gọomentị kwuru banyere ihe a kpọrọ "Revolution" na etu a ga-esi hụ ndị so mee ya bụ ngagharịiwe so mee ka ndị mmadụ gbajọọ atụmatụ a.
Ejike Kanife bụ onye ntaakụkọ gara ileta ngagharịiwe sị na ọ bụ ụjọ mere ndị mmadụ ji gbajọo ngagharịiwe a.
"Ndị bịara ihe a pere ezigbote mpe. Ha erughi iri abụọ. Ọ bụ ujọ ego ole ha ga-akwụ iji gbapụta onwe ha n'aka uweojii mere ha jiri gbajọọ ya."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị ọha na ama anọghị na soshal midia amaghị maka ngagharịiew a.

"Ndị nkiti na-agara onwe ha na-ajụ ihe na-eme. Nke a gosiri na ndi na-ekwu maka ihe a bụ sọsọ na soshal midia ka ha na-aba mba."
Ka ọ kwụ ugbua, Maazị Sowoere ka nọ na mkpọrọ, ebe ndị uweojii akpọrọla ndị ha nwụchịrị gawa ụlọọrụ ha.
Amabeghi ma ha a ga-aga n'ihu kpụpụ ha ụlọikpe maka ịgba obodo mgba okpuru dịka ha kwuru.
Lee etu ya bụ ngagharịiwe siri gaa:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ nwereike ị masị gị:










