Manchester United News: 'Wheel' Ole ji buru ndị Man Utd ọdapụla daba n'ime ọhịa?

Ole Gunnar Solskjaer

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, 'Ole' mgbe ihe mgbu Man Utd ga-akwụsị?
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Manchester City tụgharịrị ọgbọegwuregwu Man Utd site na "ọgbọ nrọ" (Theatre of dreams) mee ya ka ọ bụrụ "ọgbọ ihe mgbu" ka ha meriri ha n'abalị.

Ka dimkpa ndị Manchester abụọ a zutere, City zọgburu United ma merie ha; nke bụ mmeri nke ise ha ga-enweta n'ime otu ọnwa.

Mmeri a mekwara ya nke ugboro asaa a na-emeri ha n'ime asọmpi itoolu niile ha sọrọla na nso nso a.

Ebe o si ka njọ bụ na enwebeghi egwuregwu ha gbara a na-enyebeghi ha goolu n'ime 12 ha gbarala nso nso a.

Wolves na Man Utd
Nkọwa foto, Ndị Wolves bu ụzọ taa ha arụ nke ugboro abụọ n'otu izu iji sị Ole "nnọọ"

Kemgbe Man Utd chizuru Ole Gunnar Solskjaer echichi "onye nchịkọta" ha n'ọnwa Maachị, ọ bịara dị ka ha ebidoziri ịkwọ mmiri, makana ha enwetebeghi onwe ha kemgbe ahụ.

Ka ihe na-erughi otu izu gara, Barcelona ezute ha ma gosi ha nke tọrọ fada mgbe ha zutere na Champions League.

Barcelona
Nkọwa foto, Barcelona meriri ha ma chụọ ha ụra n'anya n'azụ ụlọ ha

Man Utd kutere obere ume n'ụbọchị 13 nke ọnwa Eprelụ a ka ha meriri West Ham, mana ume ahụ anọzughi ka onye mechiri otu anya ya rahụ ụra.

Ihe mgbu ha bịara malite ọzọ, makana ha bịara zute Barcelona n'ụkwụ nke abụọ na Champions League, ebe Barcelona zọpụrụ ha nsị n'afọ ma chụlaa ha.

Barcelona
Nkọwa foto, Barcelona tere Man Utd ure na Nou Camp.

N'ime otu ọnwa Eprelụ a, ụbọchị ụka "Easter", ndị Everton welitere isi gosi Man Utd nkarị ma taa ha ka anụ ọkụkọ akaghị aka.

Ha ji goolu anọ chara acha gbarie ha anya n'ọgbọegwuregwu Goodison Park.

Everton
Nkọwa foto, Everton ekweghi ka ndị Man Utd soro Kraịst bilite n'ọnwụ ụbọchị 'Easter' dịka otu onye na-agụ BBC Igbo si kwuo

Ka a na-eche na ihe ji ha nwere ike ịhapụ ha aka, Man City eburu nke ha bata na '18', mee ha ịwa n'azụ ụlọ ha bụ Old Trafford.

Ha ji ọkpụ goolu abụọ merie ha, nke bụ mmeri nke atọ ha nwetara n'ime mkpụrụ ụbọchị itoolu.

Man City
Nkọwa foto, Man City kpọrọ ha ntu n'isi n'ihe bụ izu "ihe mgbu" ndị Man Utd

Mmeri ole a emeela ka ndị na-akwado Man Utd gbanye aka n'isi na-eti otiti sị "chụpụnụ Ole, anyị achọghịzị ya".

Lee ụfọdụ ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru:

@TheLifeOfKiikan kwuru sị na ụgbọala Ole ji buru Man Utd akpọkasịala kemgbe Ole bidoro ịnya ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@slightlynerd kwuru sị na ndị nwe Man Utd gaara eche ka afọ nke a gwụ tupu ha echie ya "onye nchịkọta".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@TWEETORACLE kwuru sị na ọ dị ka ọ gaara akara Man Utd mma iche ka afọ a gwụ tupu ha akpọbata onye nchịkọta maara ihe ụwa na-akọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@Herleelu_usmern sị na ọ bụ ihe si n'ọchịchị Jose Mourinho bụ onye Ole nọchiri ka Man Utd ka na-arịa ruo ugbua.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụkọ ga-amasị gị: