Buhari agaala mba Briten

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Akụkọ ndị dị mkpa taa:

Buhari agaala Briten

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmaad

Nkọwa foto, Kemgbe afọ 2015 ọ banyere ọchịchị, Buhari agaala njem mba ndị ọzọ ihe kariri otu afọ

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari azọpụla ụkwụ ije gawarala onwe ya mba Britain ụbọchị Tọzde.

Dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ Femi Adesina siri kọwapụta n'ozi o wepụtara,Buhari ga-anọ njem ya rue abalị ise nke ọnwa Mee.

A kpọghị okwu aka ihe ọ gara ime n'Alabekee mana e kwuru na njem ya enweghị ka o siri gbasa ọchịchị obodo.

Buhari zopụrụ ije dịka ọ gbapechara ọrụ ụfọdụ na Maiduguri,Borno steeti.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria

Mike Zhang
Nkọwa foto, Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria

Emir nke Kano bụ Mohammed Sanusi echiela Mike Zhang echichi ' Wakilin Yan Chanan' nke pụtara 'onye nnochite anya ndị China.'

Mike Zhang
Nkọwa foto, Mike Zhang abụrụla onye China mbụ a ga-echichi ọdịnala na Naijiria

Ọnụ na-ekwuru alaeze Kano bụ Saadatu Baba-Ahmed kwuru na nkwanyere ugwu na-esote mbawanye ndị ojiegoachụego ndị China na-etinye ego na Kano.

Sịnetị akpọọla onyeisi ndị uweojii oku

Ndị ụlọomeiwu

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook

Ndị Sịnetị agwala onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu ka ọ wụchie n'ihu ha bịa kọwaa mbọ ọ na-agba iji kwụsị oke ntọọ dị na Naịjirịa ugbua.

Ha kwuru na oku a abụghị maka ịkatọọ ya mana ọ bụ ka ha tụkọta uche ọnụ mara ụzọ a ga-eji gboo nsogbu dị n'ịtọ mmadụ na Naịjirịa.

Cheta nizuụka gara aga atọọrọ ma gbuo nwafọ mba Briten bụ Faye Mooney na ndị ọzọ na Kaduna Steeti.

Buhari agaghị ekposa ndị mịnịsta ya ugbua - Lai Mohammed

O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya.

Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na oge erubeghi mgbe onyeisiala Buhari ga-eji ekposa ndị minista o ji arụ ọrụ.

O kwuru na ọ bụ mgbe ha mechara nzukọ nke ikpeazụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee.

N'ofesi

Joe Biden

Ebe foto si, EPA

N'ikpeazụ onye bụbu Osote onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwupụtala uche ya n'ịzọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka n'afọ 2020.

O kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ihe onyonyo na ugwu eji mara mba Amerịka bụ ihe nọ zi n'ihe ihe ndụ ugbua.

Biden na mmadụ iri na itoolu ndị ọzọ gụnyere sịnetọ Elizabeth Warren, Kamala Harris na Bernie Sanders ga-asọkata mpi n'inwete ọkwa a.

N'egwuregwu

PFA

Ebe foto si, PFA/Twitter

Otu jikọtara ndị na-agba bọọlụ n'Ịngland akpọọla oku megide ịkpa oke agbụrụ dị n'egwuregwu bọọlụ

Ha akwala ndị ọgba bọọlụ ka ha zite ihe na-egosi na akpasoro ha oke agbụrụ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, 'Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozigbo m nụrụ ihe na-eme, aganwụzịghị m ije'

Ọkụ gbagburu mmadụ 19n'ihe mberede okporoụzọ

ụgbọala gbara ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Ọkụ a gbagbuola mmadụ iri na itoolu gara agbamaakwụkwọ dịka ụgbọala ha nwere ihe mberede nke ọkporoụzọ,ebe 23 merụrụ ahụ n'obodo a Gwaaram dị na Jigawa steeti.

Akụkọ kwuru na mmadụ iri anọ na abụọ nọ n'ime ụgbọala na-ebu mmadụ iri na asatọ oge taya ụgbọala nke ihu gbara m, ụgbọala ha tụgharịa ụgboro ugboro tupu o nwuru ọkụ gbagbuo mmadụ iri na itoolu,ebe iri abụọ merụrụ ahụ.

E bugara ha ụlọọgwụ 'Azari Federal Medical Centre ebe ha nọ anata nleta.

World Malaria Day: Ịba ka na-akpa ike

Anwụ nta

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọmkpọrọ ahụ bụ ASP Effanga Etim, Ha kwuru na ha nyere ya ezi nleta dịka edebanyere aha ya n'ụlọgwụ General Hospital in Calabar maka nleta tupu a mụọ nwa ma bugakwa ya nnukwu ụlọọgwụ 'University of Calabar Teaching Hospital (UCTH' oge ọnọdụ ya kawanyere njọ.

Dịka a na-eme ncheta ụbọchị ọrịa ịba n'ụwa gba gburugburu, otu WHO akpoola oku ka onye ọbụla tinye uchu n'agha a na-ebu megide ọrịa ịba dịka ha gbara ama na otu nwa na-anwụ kwa nkeji abụọ ọbụla n'ihi ọrịa a.

Kwụọ anyị nde N20m maka ọnwụ Somtochukwu Ibeanusi- Ezinaụlọ ya

Ebe ụlọ elu ogogo anọ dara a daa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụmụaka si n'ụlọakwụkwọ dị na Legọs ka nwereike ịtọ n'ime ụvụrụ ụlọ ahụ

Ezinalụlọ Somtochukwu Ibeanusi, nwaata ahụ a gbagburu n'afọ 2017 oge ndị uweojii ji egbe achụsasị ndị mmadụ oge a na-emebi Ahia Eke Ukwu dị n'Owere n'Imo state chọrọ ka gọọmenti Imo kwụọ ha nde Naira iri abụọ dịka ego iti aka n'obi.

Nna nwa ahụ tiri mkpu ahụ na ụlọ mkpesa pụrụ iche e hiwere iji lebanye anya na akpamike na mgbagbu ndị uweojii na-akpagide ọha mmadụ na Ndịda Anyanwụ Naijiria nke otu jikọrọ ndị ọrụ abụghị gọọmenti a kpọrọ 'Network on Police Reform in Nigeria (NOPRIN) hiwere n'Owere ụbọchị Wenezde.

Ọrịa Meningitis egbuola mmadụ iri ise na asatọ, ebe ọrịa ahụ ji mmadụ narị asaa na iri isii na steeti iri na ise n'afọ a dịka ngalaba na ahụ maka mgbochi orịa na Naijiria bụ NCDC n'aha ịchafụ siri gbaa n'ama ụbọchị Wenezde oge e mere ncheta ụbọchị Meningitis na mbaụwa.

Ụmụaka nde 160 agbaghị ọgwụ mgbochi arụrụbara

Ụmụnwaanyị kwọ nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nchopụta ọhụrụ otu Unicef mere gosiri na ihe karịrị nde ụmụaka 160 agbaghị ọgwụ mgbochi arụrụbara bido n'afọ 2010 rue afọ 2017 nke mere ka ọrịa ahụ jalite ọzọ n'ụwa niile.

Ihe karịrị nsogbu arụrụbara ọhhụụ bụ ihe mere n'ụwa niile n'ọwa atọ mbụ n'afọ 2019.

Nwaanyịm mụrụ ejima n'ụlọmkpọọ anwụọla

Úmú ejima

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụ Igbo ụnụ echetara nwaayị mụrụ ejima n'ụlọmkpọrọ Afokan dị na Calabar n'izu gara aga?

Akụkọ na-eru anyị nti kwuru na nwaanyị ahụ onye na-eche ikpe maka ebubo izu nwa( dị ime ọnwa isi n'ọnwa Novermber afọ 2018) alaa la mụọ abalị abụọ ọ mụchara nwa n'ihi nsogbu so ọwụwa afọ a waara ya maka ịmụ ụmụaka ndị ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọmkpọrọ ahụ bụ ASP Effanga Etim,kwuru na ha nyere ya ezi nleta dịka e debanyere aha ya n'ụlọgwụ 'General Hospital in Calabar' maka nleta tupu a mụọ nwa ma bugakwa ya nnukwu ụlọọgwụ 'University of Calabar Teaching Hospital' (UCTH) oge ọnọdụ ya kawanyere njọ.

N'egwuregwu

Man City egosila Man. U nkarị

Bernardo Silva

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Bernardo Silva kpara ike n'asọmpị ndị Man City na Manu U karịcha ndị egwu ndị ọzọ dịka o nyere goolu nke 14 ya n'agba a

Manchester City kụrụ Manchester United isi aba okpu dịka ha nyere ha ọkpụ abụọ asataghị ihe n' asompi ha nwere na Old Trafford n'abalị Wenezde.

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile