Ibrahim Idris nwere ike ịza ajụjụ n'aka Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Obi mebiri ọtụtụ ndị mmadụ oge onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na aka na-achị ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nupuru isi n'iwu o nyere ya.
Buhari gwara Idris ka o biri na Benue ruo mgbe a ga-akwụsị igbu mmadụ na steeti ahụ.
Mana Idris nọrọ na Benue nanị mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu ọ laghachị Abuja.
Na nleta Buhari biara ịleta ndị Benue ụnyaahụ, o kwuru na o juru ya anya na Idris mere ụdịrị ihe a.
Mana ndị okachamara BBC kpọrọ n'elu ekwentị kwuru na ọ rara ahụ ikweta na onyeisiala obodo amaghị ebe onyeisi ndị uweojii nọ mgbe niile, maọbụ ebe ọ nọ arụ ọrụ.
Larry Oguego bụ onye ọkachamara gwara BBC Igbo na ọ bụ ihe ihere na ihe a na-eme na Naịjirịa.
O kwuru sị "n'uche m onyeisiala anyị maara na Idris anọghị na Benue, ihe eji sị Idris gawa Benue n'oge mbụ bụ maka mkpu ndị Naịjirịa na-eti."
Gee n'uju ihe ọkammụta Larry Oguego kwuru maka okwu nke a.










