Gunnar Solskjaer: E meela nwaamadị ahụ onye nchịkọta Man. Utd

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwu bọọlụ Manchester United enyela Ole Gunnar Solskjaer ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ha maka afọ atọ.
Ndị Man. U nyebụrụ nwaamadị ahụ nwa ọrụ kemgbe ọnwa Disemba ka ha chụchara Jose Mourihno.
Oge Solskjaer bidoro ọrụ, Man.U nọ n'ọnọdụ nke isii na 'Premier League' ma were pọịnt 11 achụ ọkwa nke anọ.
Mana ugbua naaní otu gboro ka a gbagburu ha n'asọmpí 13 ha na Arsenal sọkọrọ n'ọnwa, ebe ha ji naanị pọint abụọ achụ ndị Arsenal ndị n'ọnọdụ ikpeazụ na Champion League.
Solskjaer gbaburu Man.U bọọlú agba 11 ma nyere ha goolu nyere ha mmeri na 'Champion League' afọ 1999.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Solskjaer na obi bụ ya Solskjaer nụ maka ihe a mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
"Nke a b m na-arọ nrọ ya kemgbe. ihe nke atọgbuola m na m ga-achịkọta otu egwu a ogologo oge."
"Bido n'ụbọchị mbụ m bidoro, ọ dị m ka onye nọ n'ụlọ ya. Ọ bụ ihe nkwanye ukwu ịgbara Manchester United bọọlụ ma bidokwa ọrụ dịka onye nchịkọta na ya."
"Onwa ole na ole gara aga dị m ịtụnanya."
Ụfọdụ ndị ihe Man.U na-amasị achọghị Ole
Oge Solskjaer bidoro, ụfọdụ ndị ihe Man.U na-amasị ekwenyechaghị na ya.









