Ụlọikpe sị Maina weta otu ijeri naịra ma ya chọ isi be ya abịa ikpe

Ebe foto si, FACEBOOK/ABDULRASHEED MAINA
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja sị onye bụbụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka bụ Abdulrasheed Maina ka o wete otu ijiri naira iji nwe ohere isi be ya na-abịa ikpe.
Maina pụtara n'ihu Ọkaikpe Okon Abang tata ịzara ọnụ ya maka ebubo mpụ na nrụrụ aka mgbe ọ ka nọ n'ọrụ ọha.
N'iji nye ya ohere isi be ya abịa ikpe, Ọkaikpe Abang sị ka Maina kpọta mmadụ abụọ ga-anara ya aka ebe.
Ndị ga abụrịrị ndị omeiwu sịnetọ ga-enye ụlọikpe nde narị naịra ise ma nwekwa ụlọ n'obodo Asokoro di n'Abuja.
Buhari sị ka ndị ọrụ ikpe tinye uju maka ihibe ụlọikpe ọpụrụiche

Ebe foto si, Getty Images
Ka anyị malite n'Abuja ebe onyeisiala Mohamadu Buhari sị ndị ọrụ ikpe ka ha hụ na-ehibere ụlọikpe ọpụrụiche ga-enye aka n'ịhụ na ekpere ikpe ọsịsọ na Naịjirịa.
Buhari kwuru nke a na nzukọ ndị ọkaikpe opụrụiche na-aga n'ihu n'Abuja
Anyị enweghi ndi ehibere maka ịlụsị Ipob ọgụ - Ebonyi steeti

Ebe foto si, Getty Images
N'Ebonyi steeti gọọmentị akatọọla ebubo a na-ebo ha hibere otu akpọrọ "Bakassi Boys" iji lụsị ndị Ipob ọgụ.
Maazị Stanley Emegha bu Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Ebony sị na asịrị a ndị kpọro onwe ha "The Biafra Restoration Voice" na ekesa abughị eziokwu maka o bụ sọsọ otu akpọrọ Neighborhood Watch ka Ebonyi nwere maka nchekwa
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ihe ruru mmadụ iri ise na isii anwụọla na mbụze oke mmiri bụtere na mpaghara West Pokot nke Kenya.
Mmadụ iri atọ ndị ọzo ka na efuefu ebe ihe karịrị narị enweghịzi ulọ na-eze n'ime ụlọ ụka na ụlọ akwụkwọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NPFL amachiela Paul Komolafe nke Nasarawa United otu afọ maka mwakpo onye obu bọọlụ mgbe ha zutere Plateau United
NPFL sị na Komolafe kwanyere ndị na-akwado ha ịwakpo ndị na-ahị ya bu egwuregwu
A dakwara otu egwuregwu ahụ ọkankụ ego.

Ebe foto si, Getty Images
Otu Nwaanyị a kpọrọ Temitope Akinola dị afọ iri anọ na abụọ ji ọgwụ 'Sniper' gbuo nwa nwa ya iji gbochie ọlụlụ di na nwunye nne na nna nwata ahụ.
Nwaanyị a bi n'Isote nke Sagamu dị n'Ogun Steeti kpara arụ a n'ụbọchị Tọzde mana ndị uweojii na ngalaba ahụ nwụchiri ya n'otu ụbọchị ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uwojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi nwaanyị a kpọrọ nna nwata ahụ asị nke mere mgbe nne ya gara ịsa ahụ ka ọ were ọgwụ 'sniper' cheenye nwata ahụ n'ọnụ.
Mgbe nne ya sachara ahụ wee pụta, ihe o zutere a bụrụ ozu nwa ya ka ọ tọgbọrọ n'ọnwụ.
Mgbe ndị uweojii gbara nnenne nwata ahụ ajụjụ, ọ sị na ọ bụ ya gburu nwata ahụ maka na ọ chọghị ka nne ya lụọ nna ya.
Dịka ọ dị ugbua, e bugala ozu nwata ahụ n'ụlọọba ozu nke ụlọọgwụ Mahadum Olabisi Onabanjo ebe a ga-enyocha ya.
Okpomọkụ achagbuola ụmụaka abụọ n'ime ụgbọala

Ebe foto si, FACEBOOK
E bola nne nwaanyị ebubo ọnwụ ụmụaka ya abụọ ka a chọpụtara ozu ha n'ime ụgbọala na-ekpo ọkụ na Queensland dị n'Australia.
Ndị uweojii chọpụtara ụmụaka ahụ dị afọ otu nakwa afọ abụọ n'ọnọdụ ekughị ume. Amabeghị ka ha si nọdụ n'ime ụgbọala ahụ.
Mana otu onye uweojii kwuru na ahụ ụmụaka ahụ na-egosi na ọ bụ ọkụ chagburu ha n'ime ụgbọala ahụ.
Kerri-Ann Conley dị afọ iri asaa bụ nne ụmụaka ahụ bu onye mbụ eboro ebubo igbu mmadụ kamgbe adọtịrị iwu ka ọ gụnye ejighị ndụ mmadụ kpọrọ ihe'.
'Nye nu onyeisiala na ndị gọvanọ ohere ọchịchị ugboro atọ'

Ebe foto si, Uche Akolisa
Otu onye APC n'Ebonyi steeti bụ Charles Oko Enya agwala ụlọikpe dị n'Abakaliki ka e nye onyeisiala na ndị gọvanọ ohere ịchị nke ugboro atọ.
Ọ sị na ọchịchị ugboro abụọ megidere iwu ikike dịrị onye n'Afrịka.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Leciester City na ha achọla ighọ elelie nwa ite anya ọgbọnyụọ ọkụ n'asọmpi league dịka ha bụ ndị abụọ n'ogogo tebụlụ.
Otu egwu na ha akpala ike dị egwu etu ha si mee ya n'afo 2016 mgbe ha buru Iko premier league.
A ga-ewepu ikpe ọnwụ n'iwu akpọrọmasị

Ebe foto si, Nigerian Senate
Sịnetọ Sabi Abdullahi kwadoro iwu okwu akpọmasị ekwuola na ọ ga-ewepụ ikpe ọnwụ dịka ntaramahụhụ nye onye dara iwu a.
Abdullahi onye kwụpụtara nke a n'ụbọchị ụka sị na ndị ụlọomeiwu ga-ahazitụ iwu a mgbe ha ga-ezuko ịdọrịta ụka maka ya.
'Operation Kpochapụ' n'Anambra Steeti'

Ị nụtụla maka Operation kpochapụ n'Anambra Steeti bụ emume ndị uweojii sị ha ji ekpochapụ mpụ n'ọnwa emba ndị a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na ha anwụchiela mmadụ iri asaa n'emume a bụ mere mpụ dị iche iche na steeti ahụ.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ndịagha nchekwa mba Amerịka achụọla odeakwụkwọ ndịagha nzuzo ha bụ Richard Spencer maka agwa ọjọọ onye agha nọ n'okpuru ya kpara.
Onye agha a kpọrọ Edward Gallagher nọ n'akụkụ ozu nwụrụ anwụ see foto n'Iraq nke mere e ji maa ya ikpe ma wetuo ya n'ọkwa.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Sheffield United bụụrụ agada gbachiri ụzọ nye Manchester United dịka ha jụrụ ka Man United merie ha n'asọmpi Premier League.
Ọ fọrọ tịkọm tịkọm ole ka e gbuchie bọọlụ mgbe Sheeffield bịara saa goolu mere ha ji gbaa ọkpụ atọ ọkpụ atọ.
Nkeji
Ihe nkiri











