Anger Management: Etu i ga-esi gbanahụ igbu mmadụ n'iwe

Ụmụakwụkwọ bu okwute na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Otụtụ akụkọ maka ndị jị iwe gbuo mmadụ na-ewu na soshal Midia. Nke mere ka anyi na Dọkinta na-ahụ maka echiche na akparamaagwa tule ya bụ ihe.

Anyị kpọtụrụ dọkinta Tolulope Oko-Igare onye bụ kwa onyeisi ụlọakwụkwọ na-ahụ maka ndụmọdụ akpọrọ 'Institute of Counseling' dị na Legos na Rivas steeti ka ọ kọwaara anyị etu mmadụ ga-esi gbochie ịjị

iwe gbuo ọchụ ma ọ bụ mee ihe na-ezighi ezi.

Nwoke obi gbawara maka ọkụ mmanụ ụgbọala na Legos

Ebe foto si, Getty Images

Kedu ihe mbụ ị kwesiri ime?

Onye na-enye ndụmọdụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O dị mkpa ka ị gaa nyọcha

Tolulope Oko-Igare kwuru na ihe mbụ mmadụ niile kwesiri ime bụ ị ga mee nyocha ka ị mara ma ị nwere nsọgbụ akparamaagwa na-ebute iwe ọkụ nke bụ 'Personality Disorder' na Bekee.

Oko-Idare na akọwa na ọtụtụ mgbe, ihe mmadụ gabigara na nwata ma ọ bụ ihe mmadụ mụtara na nwata na-eso eme ka mmadụ nwe nsọgbụ iwe ọkụ.

O kwụkwara na ụkpụrụ omume mmadụ nke a na-akpọ 'Personality' na Bekee sokwa ebute iwe ọkụ.

Ukpụrụ omume ndị a bụ 'Sanguine', 'Choleric', 'Melancholy' na 'Phlegmatic' n'olu Bekee.

O kwuru na n'ime ụkpụrụ omume anọ ndị a, na ọ bụ ndị nke 'Choleric' na akacha enwe nsogbu iwe ọkụ.

Ọ sị kwa na ihe kpatara nke a bụ maka na "ha na-achọkarị ka ndị mmadụ mee etu ha siri chọọ".

Oko-Igare kwukwara sị " Mmadụ kwesiri iwe iwe kama iwe ahụ bụruzịe mmegbu ma ọ bụ na-eme kwa mgbe, onye ahụ nwere ike i nwe nsọgbụ iwe oku".

Kedu ihe ị ga-eme ma iwe wee gị?

Gụọ ọnụ ọgụgụ ma gwa onwe gị okwu

Dịka Oko-Igare sị gwa BBC, mgbe ọ bụla iwe chọrọ iwe mmadụ, ọ dị mkpa ka onye ahụ jide onwe ya aka.

Nke a nwere ike bụrụ n'ụzọ ị gụ ọnụ ọgụgụ nwayo nwayọ site na otu ruo iri ma ọ bụ iri abụọ.

Ị kwesiri ime nke a tupu i kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe ọbụla.

Nke a ga-eme ka iwe gị beleta.

Sị ebe ahụ pụọ

Nwoke na-aga ije

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ dị mma ka ị sị ebe ihe na-akpasu gị iwe pụọ

Nke abụọ ọ kwara BBC bụ ka onye ahụ si ebe ahụ ihe na-agbasu ya iwe pụọ.

Maka na ị nọro ebe ahụ, ihe ahụ gbasuru gị iwe ga na ebuli kwa iwe gi.

Wetuo ume gị ala

Oko-Igare kwukwara na o dị mma mgbe ọbụla iwe chọrọ iwe mmadụ, ka onye ahụ jiri nwayọ na-eku ume.

Dịka ị na-eme nke a, ị na-agwakwa onwe gi okwu ka iwe gị beleta.

Umeala so n'ihe na-ewetu iwe ọkụ.

Ịwepụ uche gị- 'Aversion Techniques'

Rụba Bandị
Nkọwa foto, Ụfọdụ na-eji RụbaBandị egbochi iwe ọkụ

Ufọdụ ndị iwe ọkụ na-ewe karị nwere ike ịme ihe a na-akpọ 'Aversion Technique' n'olu Bekee.

'Aversion Technique' pụtara ịme ihe dị iche iche iwepụ obi gị na ihe ahụ na-akpasu gị iwe.

E nwere ihe mgbanaka nke ọ na-abụ mgbe iwe gị lara elu o nwere ike tụọ gị mbo ịchetere gi ka ị wetuo obi ma wepụ kwa uche gị na ya bụ iwe.

Oko-Idare kwuru na ị nwekwara ike iyi rụba bandị na-aka gị nke bụ na mgbe iwe ọkụ ahụ biara, ị were ya tụo onwe gị mbọ.

Ihe kacha mkpa

Mgbochị ọrịa ka ọgwụịgwọ ya.

Nke mere na ihe kacha mkpa bụ ka onye ọbụla gaa mee nyọcha.

Ihe ọzọ i nwere ike ịme bụ ị jụ ndị mmadụ ma ị na-akpa agwa ka onye nwere iwe ọkụ.

Nke ọzọ bụ ka nne na nna hapụ ị kuziri ụmu ha iwe ọkụ dịka mgbe ha ji iwe agwa ha okwu ma ọ bụ tie ha ihe.

Ọzọ bụkwa ndị nne na nna lebara ụmụ ha anya ma ha hụta iwe ọkụ n'agwa nwa ha, ka ha bido n'ọge chụwa ewu ojii tupu abalị erụo.

Akụkọ ga-amasị gị