Anambra state: Ịgụ-Arọ Ndị Igbo kpọtụrụ tata na Nri

Eze Nri Obidiegwu Onyeso mere emume ịgụ Arọ ndị Igbo nke na-amalite afọ ọhụrụ n'ọnụọgụgụ afọ n'ala Igbo.
Ọ bụ n'obi ya ka e mere ya bụ emume taa bụ Satọde, ụbọchị 15 nke ọnwa Febrụwarị 2020.
Igụ Arọ n'omenala Igbo bụ mmemme eji amalite ịgụwa afọ ọhụrụ, ma malitekwa ịkọ ugbo na ịzụ ahịa ọhụrụ dịka omenala Igbo gbo gbo siri dị.

Ya bụ mmemme bụ nke ndị Nri na-eme kwa afọ dịka ndị kwuru na ha bụ isi omenala Igbo.
Eze Nri bụ Obidiegwu Onyeso gbara afọ 32 n'oche Eze bụ onye nwa ya bụ Reagent Prince Ikenna Onyeso nọchitere anya ya gụrụ ya bụ afọ na nnọchite anya ndị Igbo niile.

Na Obi Eze Nri, ndị Eze Obodo dị iche iche na ndị omenala zukọrọ were gọọ ala dịka ndị nnanna anyị ha siri mee ya ma nyekwa ndị ọrụ ugbo akụkụ ubi ha ga eji wee malite ya bụ afọ ọhụrụ.
Dịka ọ na-agọ ya bụ afọ Eze Ikenna Onyeso kpeere ndị Igbo ekpere ka afọ ọhụrụ 2020 diri ha na mma.

President General Ohaneze ndị Igbo bụ Chief Nnia Nwodo bịakwara ya bụ mmemme igụ arọ.
Lee ka o si gaa n'uju ya
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










